Ben Enwonwu: Gịnị ka ị ma maka nwoke a e ji eme ọnụ?

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Gịnị ka ị ma maka Ben Enwonwu, otu dimkpa tinyere Naịjirịa n'ụwa n'okwu nka na ise ihe?

Ọ bụrụ na ị mabughi, mara ya ugbua na Naịjirịa nwere mmadụ, nke ọkpụ ihe na ose ihe bụ Enwonwu so n'ime ya.

Ọ bụrụ na ọ dị ndụ ugbua, ọ gaara adị afọ 103; mana afọ 2020 a mere ya afọ 26 dimkpa a lara mmụọ.

Ọ nwụọla, mana ihe ndị o ji aka ya kpụọ ma see, mere ka ọ ka bụrụ onye a kpụ n'ọnụ.

Nso nso a, n'afọ 2019, ka otu ihe o sere n'afọ 1974 nke a kpọrọ 'Tutu' mụtara otu nde paụnd na ọma (£1,205,000) mgbe e rere ya.

O ji ọlanchara kpụọ akpụrụakpụ Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth nke abụọ oge ọ ka bụ nwaagbọghọ, mgbe ọ na-akwado ịbịa Naịjirịa n'afọ 1957.

E mechara gosiputa akpụrakpụ ahụ na "Royal Society of British Artists" (RBA) ebe ndị mmadụ bịara gbaa ya nkiri n'afọ ahụ.

Onye bụ Ben Enwonwu?

  • A mụrụ Benedict Chukadibia Enwonwu n'ụbọchị 14 nke ọnwa Julaị n'afọ 1917
  • Ọ bụ ejima
  • A mụnyere ya n'ezinaụlọ Umueze-Aroli dị n'Ọnịcha, Anambara steeti
  • Ọ gara akwụkwọ sekọndịrị na Government College Ibadan ma gụchapụ na Government College Umuahia
  • Ọ gara 'mahadum' na Slade School of Fine Art, University College dị na London
  • Ọ kuziri ime nka na Government College Umuahia, Mission school dị na Calabar nakwa Edo College dị n'Edo steeti
  • Ọ mụtara ịkpụ ihe site n'aka nna ya na-akpụbu ihe
  • Ọ rụrụ dịka onye ndụmọdụ nye gọọmentị n'ihe gbasara nka n'afọ 1948
  • N'afọ 1954 e mere ya OBE nke bụ 'Member of the most distinguished Order of the British Empire'
  • Ị ga-ahụ ụzọ a gụrụ aha ya n'ebe a na-akpọ 'enu Ọnịcha' n'Ọnịcha dị n'Anambara steeti
  • Ọ nwụrụ n'ụbọchị ise nke ọnwa Febrụwarị n'afọ 1994, kaka ọ na-arahụ ụra.

Naịjirịa nyere ya ihe nrite Nigerian National Order of Merit n'afọ 1980 maka ihe o mere n'ụwa nka.

E gosiri nka ya, ma nke e sere ese ma nke akpụrụ akpụ na mpaghara ụwa dị iche iche.

Ebe ndị e gosipụtara ya gụnyere Legọs, Glasgow dị na Skọtlandị, Lọndọn, Mịlan dị n'Itali, mba Amerịka na ebe ndị ọzọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị: