Isabel Dos Santos: Etu nwa ada a si baa ọgaranya site n'ire obodo ya bụ Angola tọrọ

Isabel dos Santos attends the screening of "BlacKkKlansman" during the 71st annual Cannes Film Festival at Palais des Festivals on May 14, 2018 in Cannes, France

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Akụkọ a si n'aka otu BBC Panorama
    • Ndị mere akụkọ a, Otu BBC Panorama

Isabel Dos Santos bụ nwaanyị kacha baa ọgaranya n'Afrịka mana o rere obodo ya bụ Angola tọrọ iji wee baa ọgaranya.

Akwụkwọ dị iche iche nke BBC hụrụ gosiri etu Isabel si nweta ikike ire ala, mmanụ agbidi, dayamọnd nakwa ịrụ ụlọọrụ nzikọrịta ozi oge nna ya bụ onyeisiala Angola.

Akwụkwọ ndị ahụ gosiri etu Isabel na di ya si nweta ikike izụrụ akụnụba obodo Angola n'ụzọ n'ezighi ezi.

Mana ya bụ nwa ada ahụ agọrọla ọnụ ya kwuo na aka ya dị ọcha n'ebubo nrụrụaka a na-ebo ya.

O kwukwara na ebubo ahụ bụ aka ọrụ ndị na-agba ya mgba okpuru maka ndọrọndọrọ ọchịchị ọ na-akwado ịpụta.

Onye bụ Isabel Dos Santos

Isabel Dos Santos na di ya Sindika Dokolo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Isabel Dos Santos na di ya Sindika Dokolo

Isabel Dos Santos bụ ada aka chịbụrụ mba Angola bụ Jose Eduardo Dos Santos.

Nna ya chịrị Angola afọ iri atọ na asatọ.

Isabel jizi mba Briten mere ebe obibi. O nwere ụlọ na ihe ndị ọzọ dara oke ọnụ n'obodo London

Mana ugbua a na-enyocha ya maka ebubo nrụrụaka bụ nke gọọmentị Angola boro ya.

Gọọmentị Angola ejichiela ego na ihe ndị ọzọ Isabel nwere n'Angola.

Ugbua, BBC Panorama enwetala akwụkwọ gosiri nrụrụaka niile Isabel tinyere aka na ya nke mere ka ọ baa ọgaranya nke ukwu.

Ọtụtụ n'ime akwụkwọ ahụ si n'aka otu International Consortium of Investigative Journalists (ICIJ) otu jikọrọ ọtụtụ ndị ntaakụkọ n'akụkụ ụwa niile.

Matter Business Solutions invoice
Nkọwa foto, Ọtụtụ akwụkwọ gosiri etu Isabel Dos Santos si mefuo ego mba Angola

Mgbe Eduardo Dos Santos bụ onyeisiala Angola, o mere Isabel nwa ya onyeisi ụlọọrụ mmanụ agbidi a kpọrọ Sonangoln'afọ 2016.

Mana oge ọ rituru, onye nọchiri ya bụ Joao Lourenço chụturu Isabel n'ọkwa.

The Angolan state oil company Sonangol has a subsidiary in London.
Nkọwa foto, Sonangol bụ ụlọọrụ mmanụ agbidi nke Angola

Mgbe Isabel na-achọ iritu, o binyere aka ka a kwụọ ụlọọrụ a kpọrọ 'Matter Business Solutions' ego dị nde dọla 58 ($58 million).

O doghi anya ihe o ji kwụọ ụgwọ ahụ.

Mana nchọpụta ndị ntaakụkọ mere gosiri na onye nwe ụlọọrụ 'Matter Business Solutions' bụ enyi Isabel.

Isabel na di ya Dokolo nwetara ọtụtụ ego site n'ịzụ ahịa ọla dayamọnd

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Isabel na di ya Dokolo nwetara ọtụtụ ego site n'ịzụ ahịa ọla dayamọnd

Nchọpụta gosikwara etu di Isabel, Sindika Dokolo, si mịa ego ụlọọrụ Angola na-arụpụta ọla dayamọnd a kpọrọ Sodiam.

Dokolo na Sodiam nwere nkwekọrịta n'afọ 2012 ịgbakọ aka tinye ego na ụlọorụ Swizaland na-emepụta ọla e ji achọ mma nke aha ya bụ De Grisogono.

Ka ọnwa asatọ gachara ha nwere nkwekọrịta ahụ, Sodiam kwụrụ nde dọla 79 ($79) mana Dokolo kwụrụ naanị nde dọla anọ ($4)

Sodiam kwụkwara Dokolo nde euro ise maka ya bụ nkwekọrịta, nke pụtara na otinyeghi ego ya ọbụla na nkwekọrịta ahụ.

Onyeisi ụlọọrụ Sodiam bụ Bravo da Rosa, gwara BBC na ụlọọrụ ahụ ga-akwụ nde dọla $200 tupu ha akwụchaa ụgwọ Dokolo tinyere ha n'ime ya.

Angolan shanty town
Nkọwa foto, Pasentị iri atọ ndị mba Angola dara ụbịa ọnụ ntụ

Andrew Feinstein, onyeisi otu 'Corruption Watch' kwuru na Dos Santos ji akụnụba dịịrị ndị Angola niile wee baa ọgaranya naanị ya.

"Oge ọbụla ị hụrụ Isabel ebe ọ na-emekasị ego, mara na ọ bụ olileanya ndị mmadụ nkịtị na Angola ka ọ na-azọ ụkwụ."

Okwu ala

Akwụkwọ BBC hụrụ gosiri etu ụlọọrụ Isabel si zụrụ ala n'aka gọọmentị mana ọ kwụchaghị ụgwọ ya.

Ọ bụ site n'ikike nna ya nyere ka Isabel ji zụta ala ahụ dị n'akụkụ osimiri n'obodo Luanda

Ego ala ahụ kwesịrị ịbụ nde dọla 98 ($98) mana Isabel kwụrụ naanị pasenti ise ego ahụ.

Gọọmentị chụpụrụ ọtụtụ ndị mmadụ bi n'ala ahụ iji mee ka ụlọọrụ Isabel weghara ya.

Otu n'ime ndị a chụpụrụ ebe ahụ Teresa Vissapa onye mụrụ ụmụ asaa.

Vissapa kwụrụ sị: "A na m arịọ Chukwu ka o metụ ya aka n'obi ka o chee ihe anyị na-agabiga."

"O nwere ike ọ maghị ya, mana anyị na-ata nnukwu ahụhụ ugbua."

Isabel jụrụ inye ọsịsa ọbụla gbasara nke a.

Ụlọọrụ nzikọrịta ozi ekwentị

Leaked documents show Isabel dos Santos signed off on loans from Unitel as both the borrower and the lender.
Nkọwa foto, Akwụkwọ gosiri etu Isabel si were biri ego n'aka Unitel. O binyere aka dịka onye mgbazinye ego nakwa onye na-ebiri ego.

Aka Isabel dịkwa n'ụlọọrụ nzikọrịta ozi kachasi n'Angola bụ Unitel.

Ọ zụrụ 'share' ruru pasentị 25 n'ụlọọrụ ahụ nke ego ya ruru otu ijeri dọla ($1 billion).

Unitel akwụọla Isabel ihe ruru otu ijeri dọla ($1 billion) kamgbe afọ 2000 ọ zụrụ 'share' ha.