You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọ bụ mmadụ abụọ, ọ bụghị asaa ka nwaokorobịa gburu n'Imo steeti - Uweojii
Otu nwaokoroọbịa a na-eche na isi adịchaghị mma wakporo ma gbuo mmadụ abụọ ndi mmadụ n'obodo Nempi dịka ndị uweojii Imo steeti si kwuo.
Akụkọ na-efegharị na sochal midia kwuru na isi kopuru otu nwata nwoke, o were mma gbuo mmadụ asaa ndị ezinaụklọ ya nke mere ka ndị ntorobia obodo ha gbaa ya ọku.
Mana Orlando Ikoku bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti kwurụ na ọ bụ naanị mmadụ abụọ, ka o gburu, ma merụọ mmadu isii ahụ.
Na nkọwa ihe mere n'ezie, Ikoku sị, "Nwoke a were mma na-achụgharị ndị mmadụ sị na ya ga-egbu ha."
"O mechara gbuo otu onye nche si ọrụ ala nakwa otu nwa nwaanyị dị afọ iri."
"Ka ọ na-akpa ike a, ndị mmadụ nwuchiri ya ma mecha gbuo ya."
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị mmadụ gburu nwoke ahụ, gbaa ya ọkụ.
Ugbua, ọ sị na ndị uweojii ka na-eme nchọpụta maka ihe a mere.