World food day: Ụdọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị

Agbụgbụ na ji

Nri a bụ agbugbu ma ọ bụ fịọ fịọ dịka ụfọdụ sị akpọ ya.

Ọ na-adị ka agwa mana ọ bụghị agwa.

Ị gwọ fịọ fịọ na ji, ịtabiri aka.

Ị nwekwara ike itinye ya ụkpaka.

Akụ mkpụ

Nke a bụ akụ mgbu.

Akụ mgbu bụ ezigbo nrị mgbe gboo.

Akụ na-ada n'udummiri.

N'abali ka ọ na-adakarị.

Lee ihe nkiri

Mmiri zochaa n'abali, ndị mmadụ eburu ọkụ pụọ n'ezi, gbanye mmiri n'ọba.

Dọwa ọkụ n'akụkọ mmịrị ahụ ka ọ na-adọta akụ ahụ.

Ọtụtụ akụ ahụ adanye na mmiri ahụ.

A na-eghe ya eghe n'ọkụ tinye ya nnu.

Ị nwere ike ịta ya otu ahụ maọbụ were ya taa abacha,

Ọ na-atọwa ntị.

Ighu

Nke a bụ ighu maọbụ iwu ka ụfọdụ sị akpọ ya.

Ọ dịka abacha mana ọ bụghị abacha.

Ịghụ na-atọchị ntị ma ejiri agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ kwọọ ya.

Achichi ede

Achịchị bụ ede eberiri eberi gbaa ya n'anwụ.

Ihe a bụ ụzọ ndị Igbo si echekwa nri maka ụnwụ.

Mgbe ụnwụ ka e ji eri achịcha mgbe gboo.

A na-ejikwa agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ agwọ ya tinye ya akwụkwọ ụgbọghịrị.

E nwere ọtụtụ ihe e ji ede esi.

E nwere nke ana akpọ ede mmachu, ya bụ ede agwọrọ agwọ.

Nwekwaa nke bụ ede eko, ya bụ ebe ahụrụ n'ọkụ e ji mmanụ na akpaka eri.

Ọ na-atọchi ntị.

Anyụ

Anyụ bụ ezigbo nrị.

Ọ na-amịkarị n'udummiri.

Ọ na-atọ n'ụbụrụ ma e jiri ji gwọọ ya.

Akịdị

Nke a bụ akịdị.

A na e ji ji agwọ ya.

E nwere ike isi ya mgbe ọ dị ndụ.

Nwekwa ike ịchekwa ya n'anwụ maka ụnwụ.

Ero

Leekwa ero.

Ero na-atọ ụtọ n'ofe.

E nwere ọtụtụ ero dị iche iche .

Ụfọdụ n'ime ha adịghị mma oriri.

Nke a mere na onye amaghị anya ero a naghị akpata ero n'ọhịa.

E nwere ero a na-akpọ ata-achakaanya.

Ọ na-atọ ụtọ, mana ọ na-esi ike n'ọtita.

Ofe ụfọdụ adikabeghịzị

Ofe ụgbọgụrụ

Ofe ụkpọ

Ofe enwegii nnu

Ofe ụtụrụkpa

Ofe ogiri ohi.

Ihe nkiri

Akụkọ ga-amasị gị