Zine Ben Ali chịburu Tunisia oge 'Arab Spring' anwụọla

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa:

Zine Ben Ali chịburu Tunisia oge 'Arab Spring' anwụọla

Zine al Abidine Ben Ali

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ben Ali gbara ọsọ gbapụ na mba Tunisia oge ọgbaghara 'Arab Spring' nwuru ọkụ n'afọ 2011

Zine el Abidine Ben Ali, bụ onye ndu mba Tunisia nke gbara ọsọ gbapụ n'ala ha afọ asatọ gara aga maka ọgbaghara Bekee kpọrọ 'Arab Spring' anwụọla.

Cheta na otu nwata na-ere mkpuruosisi suru onwe ya ọkụ maka oke ahụhụ bụ ihe kpalitere ọgbaghara ahụ dịka Ben Ali chiruru afọ iri abụọ na atọ dịka onyeisiala.

Ben Ali gbagara mba Saudi-Arabia bụ ebe ọ nọrọ nwụ ụbọchị Tọzde dịka a na-akatọ ọchịchị ya maka nrụrụaka nakwa enyeghị ndị anọghị n'ọchịchị ohere ikwu uche ha.

N'afọ 2012, a kụrụ ya isi oge ọ nọghị ya dịka ụlọikpe tụụ ya nga mkpụrụ ọka na ahụghị ya anya maka ogbugbu ndị na-eme ngagharịiwe n'afọ 2011.

Naijiria na-achọ ibite $2.5bn n'aka World Bank

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya

Ụlọakụ mba ụwa bụ 'World Bank' agbaala ama na ha na Naijiria na-agba nkata maka ịgba mbibi ọhụu dị ijeri dọla abụọ na ụma ise( $2.5 billion) dịka ụlọakụkọ Bloomberg siri kwuo.

Nke a bụ n'agbanyeghị na na Naijiria gbaburu mbibi ego ruru ijeri dọla abụọ na ụma anọ ($2.5).

Osote onyeisi ngalaba Afrịka na World Bank bụ Hafez Ghanem gwara Bloomberg ụbọchị Wenezde sị, " Anyị na-akpa maka atụmatụ ego ya ruru nke a. O dị ihe dịka ijeri dọla abụọ na ụma ise."

Ụlọikpe enyela ụlọọrụ P& ID ọsọ na Naijiria

Ikpemkwụmọtọ

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka e mechie ụlọọrụ P&ID na Naijiria ma were ihe niile ha nwere nyefee gọọmentị etiti.

Chetan a P& ID gbara Naijiria akwụkwọ na mba ofesi na-achọ ka a kwụọ ha ihe ruru ijeri dọla itoolu na ụma.

Ihe Cosmas Maduka gwara ndị ntorobia Igbo

Cosmas Maduka

Nwaatụrụ ga-epu mpi, ekwo ga-esikwa ya ike.

Nke a bụ ndụmọdụ Cosmos Madụka onyeisi ụlọọrụ Coscharis nyere ndị ntorobia Igbo.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Tọọzde, Mmaduka kwuru na ịkwụwa aka ọtọ na ịdị uchu n'ọrụ so n'ihe buliliri ya.

Gaa na BBC News Igbo na Facebook ka ị nụrụ ihe o kwuru n'uju:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Asọmpi Europa

Ndí otu egwu bóólú Arrsenal na Eintracht Frankfurt

Ebe foto si, Getty Images

Asọmpi Europa league ga-ebiri ọkụ n'abalị taa maka egwu ọnụ ha erughị n'okwu Champions League.

Otu bọọlụ Manchester United, Arsenal nakwa Wolves socha na ndị ga-eso nwaa ike ha.

PSG akụpịala Real Madrid

Asọmpi PSG na Real Madrid

Ebe foto si, Getty Images

Asọmpi Uefa 'Champions League' kporo ọkụ n'abalị dịka ndị Paris Saint Germain ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu kụo Real Madrid ihe tinka kụrụ panị.

Angel Di Maria gbaburu Real Madrid bọọlụ emeghịrị ha ebere mgbe o ji ọkpụ goolu abụọ sị Madrid unu abịala.

O nyere goolu ndị a gbawara Real Madrid obi na nkeji 14 nakwa nkeji 33.

Real Madrid nwara ike ha mere Gareth Bale ji nye goolu mana a gụpụrụ ya mgbe ihe onyonyo VAR gosiri na bọọlụ kụrụ ya n'aka.

Dịka ọ fọdụrụ tịnkọm tịnkọm ole ga e gbuchie bọọlụ, PSG kụpịaziri Madrid mgbe Thomas Meunier nyere goolu nke atọ na nkeji 90.

Mmeri a PSG meriri Real Madrid mere ha ji bụrụ ndị mbụ n'ogogo tebụlụ ha n'asọmpi a.

Buhari achụọla Oyo-Ita ọsọ n'ọkwa ya

Winifred Ekanem Oyo-Ita

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ewepula onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọrụ gọọmentị bụ Winifred Ekanem Oyo-Ita ma were Folashade Yemi-Esan dochie ya.

O kwuru na nke a bụ iji nye ụlọọrụ EFCC ohere inyocha Oyo-Ita maka ebubo nrụrụaka nke a sị riri Ijeri naira atọ.

Yeni-Esan na-arụbu ọrụ dịka ode akwụkwọ Ministịrị na-ahụ maka mmanu agbidi.

Oyọ-Ita na ndị ode akwụkwọ atọ ọzọ ga-aga ụloikpe maka ebubo a.

Dịka ọ dị ugbua,mmadụ ise ekwuputala na ha ga-agba akaebe megide Oyo-Ita.

Xenophobia na Saụt Afrịka

Ndị Naijirịa si Saụt Afrịka lota

Ụmụafọ Naijirịa dị narị atọ na iri na anọ sị Saut Afrịka wuchiri n'ọdọụgbọelu Muritala Muhhamed nke dị na Legọs na ụbọchị wenezde n'elekere asaa nke abali.

Abike Dabiri bụ onyeisi ngalaba n'ahụ maka ndị Naịjiria nọ ofesi nabatara ha kwuo na gọoemtị ga-enye ha ego ụgbọala, ego nri na 'sim kad' ọhụrụ.

N'Ofesi

Nabil Karoui na-azọ onyeisiala Tunishia na ntịụliaka

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Nabil Karoui gbara abubọ nrị na mmalite onwa a maka nnwuchi anwụchịrị ya.

onye so azọ onyeisiala mba Tunisia bụ Nabil Karoui ga anọ na ụlọmkpọrọ e mee ntụliaka ọnyeisiala mba ahụ n'ọnwa Oktoba.

Anwuchiri Karoui maka ebubo akwughị ụtụisi na ịtụ mgbere ego.

N'Egwuregwu

Lee akụko ga-amasị gị

Gee Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee Ihe nkịri ga-amasị gị

Aha onyonyo, Code Club: 'Etu anyị si eji 'coding' arụpụta ihe na-egbo mkpaeme'