Justin Trudeau: Ihe mere onyeisiala a ji arịọ ndị isi ojii arịrịọ

Justin Trudeau

Ebe foto si, Reuters

Onyeisiala mba Kanada bụ Justin Trudeau arịọla ka agbaghara ya maka uhie o tere n'ihu ya mgbe ọ bụ nwata akwụkwo n'ihe ruru afọ ịrị abụọ gara aga.

Ihe a pụtara ihe ka foto Trudeau sere n'ụlọakwaụkwọ "West Point Grey Academy" gbara n'anwụ.

Trudeau sara ajụjụ ebumnuche ya maka foto a site n'ịrịọ arịrịọ sị "obi adịghị m mma maka ihe m mere. E kwesiri m ịma na mụ ekwesighi ime ya".

Foto mechuru Trudeau ihu ka ọ na-azọ ọkwa ịlọghachị dịka onyeisiala mba Kanada ga-adị n'ụbọchị 21 ọnwa Ọktoba, 2019.

Trudeau sị na ya mere ihe a makana na ya yiri ejiji Aladdin n'emume e mere n'usoro akukọ a kpọrọ "Arabian Nights".

"Ihe mere di m n'aka. Ama m ụma mee ya. Ekwesighi m ime ya."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya echeghi na ihe a ya mere bụ ihe ndi isi oji ga na-eche na ọ kwadoro ịkpaoke agbụrụ, mana ugbua ya kwenyere na ọ dị etu a.

Ọ sị "ndo nu maka ihe a m mere."

Justin Trudeau 'in 2001 brownface yearbook photo'

Ebe foto si, Time Magazine

Ọ gịnị bụ 'brownface' na 'blackface'

Ihe a bụ mgbe mmadụ - ọkachasị onye ọcha - tere uhie n'ihu iji mee ka ọ dị onye isi ojii.

Ihe mere iji wee ihe ọjọọ bụ maka ndị Bekee kpọrọ "minstrels", bụ ndị na-ebu egwu agaghari.

Ndị na adị eji ndị isi ojii eme akaja.