Rochas Okorocha: Ihe mere anyị ji kpachitụ akụnaụba ya - Ọnụ na-ekwuru EFCC n'ọwụwa anyanwụ

Aha onyonyo, Rochas Okorocha: Ihe mere anyị ji kpachitụ akụnaụba ya

Chris Oluka bụ ọnụ na-ekwuru EFCC na mpaghara ọwụ wanyanwụ sị na ọ bụ ka Sịnetọ Rochas ghara ire akụnaụba ya ndị a na-enyocha mere ha ji nata ikike ịkpachịtụ ha.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ekwentị, Maazi Oluka sị na mkpachi akụnaụba ndị a bụ naanị nwa obere oge ka ụlọọrụ ha nwee ohere nyocha ha nke ọma.

Ọ sị na ọ bụrụ na ụlọikpe sị na aka Rochas dị ọcha na ha ga-ahapụrụ ya akụnaụba ndị a mana ọ bụrụ na ikpe maa ya, na ha ga-ewere akụnaụba ndị a nyefe n'aka gọọmentị etiti.

Oluka kwuru na akụnaụba ha kpachiri gụnyere ọtụtụ ụlọ obibi a na-akpọ 'Estate' na Bekee nakwa ụlọọgwụ nke a sị na ọ bụ nke Pascal Obi rụrụ ya ọrụ mgbe ọ bụ gọvanọ Imo Steeti.

Ọ gara n'ihu kwuo na nke a apụtaghị na ọrụ ga-akwụsị n'ụlọọrụ ndị ahụ a kpachiri.

Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru Sịnetọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo, ọ sị na Okorochas anọghị nso itinye ọnụ n'okwu ahụ.

O kwuru na onweghi ikike itinye ọnụ ya ma ọ bụrụ na nna ya ukwu Okorocha enyeghi ya ikike ime nke a.

Akụkọ ga-amasị gị: