You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ebelechukwu Obiano: Ugegbe anya na-ese okwu
Nwụnye aka na-chị Anambara Steetị bụ Odozi Akụ Ebelechukwu Obiano na-ewu na soshal midia Naịjirịa maka enyo anya oyi gaa akwamozu n'Ihiala.
Akwamozu ahụ bụ nke Ichie Michael Chukwuka Onyema, bụ nna onye nwe ụlọ ọrụ ugboelu Air Peace bụ Maazị Allen Onyema emere ụbọchị Fraịde nke mbụ n'ọnwa Ọgọst 2019.
Ọbụghị sọsọ Odozi akụ Obiano na di ya bụ ndị ama ama gara ya bụ akwamozu, mana ọ bụ ya ka anya hụrụ ọfụma, maka kpọcha kpọcha enyo anya ha.
Agbenyeghi na onwere ụfọdụ na-eti mkpu maka ego ole ha na-eche na a na-ere ya bụ ugegbe, onwekwara ndị na-aja ya na ọ maka n'ihu nwụnye Governor Obiano.
BBC Igo nyochara ya bu enyo anya were chọpụta na ọ bụ ọpụrụiche ụlọ ọrụ Gucci - bụ ndị enyo mepụtara oyiri enyo anya ahụ - mere sọsọ 100.
Nke a pụtara ya bụrụ na ọ bu n'aka Gucci ka nwanyi mbụ n'Anambara gotere enyo anya ya, ọ nwereike iso n'ime 100 ahụ ha mepụtara n'usoro Bekee kpọrọ "Limited Edition Mask sunglasses with crystals".
Usoro mmepụta nke adịghị emepụta ọtụtụ bụ ihe Bekee kpọrọ "Limited Edition".
Mana lezia mgbe ọzọ Ebelechukwu Obiano kpịara enyo anya ọpụrịche: