You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nafdac: Ịtụbata ọgwụ ka uru karịa ịkụ ya - Azubuike Chukwumereije
Ndị na-akụ ọgwụ n'ala Igbo akọwala ihe mere ọgwụ a na-atụbata ji karịa nke a na-akụ na Naịjirịa.
Onye ọkụ ọgwụ bụ Azubuike Chukwumeriji sị na-atụmatụ gọọmenti hibere maka ịchekwa ya bụ ọrụ karịrị ike, na-eri oge ma dịkwa okeọnụ.
Azubuike sị na-enweghị akụrụngwa, na oke ụtụisi a na-ana ha bụ ụfọdụ ihe n'echere ha akamgba na ya bụ ọrụ.
Ọ sị, " ego ọ na-eri anyị iji mepụta ọgwụ karịrị ego eji atụbata otu ọgwụ ahụ. A na-anakwa anyị ọtụtụ ụtụisi tinyere enweghị ọkụ bụ nke na-adọhachị anyị akaelekere azụ".
Azubuike maraatụ na ya ma ndị otu ha mechichere ebe ha na-akụ ọgwụ gazia bubatawa ọgwụ maka nsogbu ndị a.
N'agbanyeghị nke a, ọ sị na ụfọdụ ndị otu ha anaghị enwe ndidi ka ọrụaka ha mitawa mkpụrụ, na ha chọrọ ego ọkụọkụ nke taa nke echi.
Otu na-ahụ maka ịchekwa ọgwụ na ahịa ọgwụ bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (Nafdac) kwuru na ụzọ asaa n'ime iri bụ ọgwụ a na-aṅụ na Naịjirịa sị mba ofesi, ebe atọ nke ọzọ si obodo a.
Ebe ndị na-akụ ọgwụ na-eche na ọ ka mma ka ọtụtụ ọgwụ a na-ego na Naịjirịa sị obodo a, onyeisioche ụlọọrụ Nafdac, bụ Ọkankuzi (Prof.) Mojisola Adeyeye sị na ihe ka mkpa bụ nke onye na-eme ya mee ya nke ọma.
Azubuike Chukwumerije na-akọwa na ọgwụ ikpo asaa a na-atụbata na Naịjirịa gosiri ego ole sị mba a aga ofesi n'ihi ọgwụ, bụ nke ekwesiri iji tinye n'ọrụ wee ndị mmadụ ọrụ.
Mbọ niile BBC gbara ị nụ ọnụ okwu onyeisioche ndị Pharmacitical Society of Nigeria bụ Sam Ohuabunwa amịtaghị mkpụrụ.