You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Eze Imo: O nweghị onye na-akwanye m ọkụ n'ike ka m chutuo Eze Ohiri - Ihedioha
Gọvanọ Imo Steeti bu Emeka Ihedioha akọwaala na o nweghị onye maọbụ ndị na-acha ya ọkụ ka ọ chutuo Eze Samuel Ohiri dịka onyeisi otu ndị eze ọdinala.
Akụkọ na-efegharị na-ekwu na Ihedioha nwere ike iwepụ Eze Ohiri n'ọkwa n'ihi ọkụ ọtụtụ ndị mmadụ na-acha ya.
Mana Steve Osuji, bụ ọnụ na-ekwuchitere Ihedioha, gwara BBC Igbo na akụkọ ndị ahụ bụ asi asi.
Osuji kọwara na ndị eze biara kelee gọvanọ abalị abụọ gara aga ma riọ ya ụfọdụ ihe.
"Gọvanọ gwara ha na ya ga-eleba arịrịọ ndị ahụ anya."
"Kedụzi nke bụ ikwanye ya ọkụ n'ike?"
Osuji gara n'ihu kwuo na o nweghị mgbe ndị eze ahụ jiri buru akwụkwọ ngagharịiwe bịa ịhụ gọvanọ.
"Onwekwanụghị mgbe ndị mmadụ ji mee ngagharịiwe n'obodo maka ihe gbasara Eze Imo."
"Ya bụ na o nweghi mmanye ọbụla dị gọvanọ n'ahụ maka nke a."
Cheta na Rochas Okorocha chuturu Eze Cletus Ilomuanya bụbu onyeisi ndị Eze Imo Steeti n'ọnwa June 2011, ma họpụta Eze Sam Ohiri ka ọ nọchie ya.
Gbasara onyeisi ụlọakwụkwọ Imsu
Akụkọ kwukwara na ndị mmadụ na-amanye Ihedioha ka ọ chutuo onyeisi ụlọakwụkwọ Mahadum Imo steeti bu ọkammụta Adaobi Obasi.
Mana Osuji kọwakwara na akụkọ ahụ bụ asị.
O kwuru na Obasi na ndị isi Imsu ndị ọzọ biakwara kelee Ihedioha abalị abụọ gara aga.
"Onweghi mgbe e ji kwute okwu maka ịchụ onye ọbụla n'ụlọakwụkwọ ahụ n'ọrụ."
Obasi na aka chịburu steeti Imo bụ Rochas Okorocha bụ otu ebe ka ha si.
Ha abụọ bụ ndị Ogboko n'okpuru ọchịchị Ideato South.
Akụkọ ga-amasị gị: