Aka uweojii akparala nwoke gbara nwa nwanne ya egbe n'Imo

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu sị na ha ejidela nwoke a na-ebo ebubo na ọ gbara nwa nwanne ya egbe hapụ ya n'ọnọdụ ọdụdụ ndụ ọnwụ ka mma.

Maazị Ikeokwu sị na Enyinna Ibekwe di afọ 50 kpọọrọ nwa nwa nwanne ya bụ Chidinma Anyanwu pụọ. Ka ọ natara, ajụọ ya nwa ya na ya so pụọ o were sị ka Anyanwu soro ya gawa ịkpọlata nwa ahụ.

"Ka ha ruru n'ebe mmadu anọghị, Ibekwe gbara Anyanwu egbe n'obi wee rapụ ya ebe ahu dịka o che na ọnwụọla. Ikeokwu sị na Anyanwu kawara ahụ wee pụọ n'okporo ụzọ bụ ebe ndị mmadu hụrụ ya wee buru ya gawa ụlọ ọrụ ndị uweojii.

Nwa ada a nọ ụlo ọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua dịka ndi uweojii siri kwuo.

Ha sịkwa na ha ji Maazị Ibekwe ma na-eme nchọpụta etu mmiri siri banye n'ime akị oyibo.

Ikeokwu si na ndi uweojii Imo na-etinye anya n'okwu dịka o si metụta igbu ọchụ na ntọri mmadụ.

Akụkọ ọzọ metụtara uweojii Imo steeti: