Senator Elisha Abbo azarala ọnu ya n'ulọikpe wee nwete akamebe nde naira ise

Ebe foto si, Elisha Ishaku Abbo/Twitter
Sinetọ Elisha Abbo gwara ọkaikpe akpụpụrụ ya n'ụlọikpe taa na aka ya dị ọcha banyere ebubo na o wakporo nwaanyi n'Abuja.
Ọkaipke Abdullahi Ilellah ji nde naira ise tụghapụ Abbo n'akambe.
Cheta na ọnụ na-ekwuru uweojii n'Abuja bụ Anjuguri Menzah sị na ha akpụpụrụ onye a na-anọchite Adamawa-North n'ụlọ Omeiwu ukwu ulọikpe.
Ihe onyono pụtara na soshal midia n'izu gara aga gosiri ka nwoke a na-eche na ọ bụ Maazị Abbo mara nwaanyị ọra n'ebe a na-ere akwurangwa eji eme mmekọ nwoke na nwaanyị.
Abbo apụtala kwenye na ọ bụ ya mere ihe a ma rịọ mgbaghara, mana dịka ihe omere megidere iwu ọha, uweojii jizi ya bụ okwu gawa ụlọikpe.
Ụlọ ntaakụkọ Punch dere na ọ bụ ụlọikpe dị na Zuba ka akpọ omeiwu a aga.





