You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Zamfara Killings: Mmadụ 34 ọzọ anwụọla ebe ahụ
Ndị uweojii kwuru na ihe ruru mmadụ iri atọ nwụrụ mgbe ndị ohi wakporo obodo Tungur Kahau n'ụbọchị Fraide.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Shehu Mohammed gwara BBC na ha ezigala ụfọdụ uweojii ebe ahụ iji kwalite ọrụ ịchọpụta ndị kpara mkpa mkpa a.
Atiku azọọla isi onwe ya
Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'okpuru otu PD agọrọla aka ya na ụkwụ ya n'ozi na-efegharị na ọ ga-eduba ụmụ Naịjirịa na ngagharị iwe maọbụrụ na ụlọikpe enyeghi ya ihe ọ chọrọ.
O kpọrọ akụkọ ahụ ọrụ aka ndị aghụghọ.
Na mba ofesi
Dịka ọ dị ugbua ebe niile na mba Argentina na Uruguay nọ n'ọchịchịrị ugbua dịka ha enweghi ọkụ latrịk.
Otu ụlọọrụ ọkụ latrịk gwara BBC na amabeghi ihe kpatara ya bụ ihe mana ọ malitere ebe elekere 11 nke ụtụtụ
N'egwuregwu,
Aka na-achịkọta otu bụ Mauricio Sarri Chelsea ahapụla otu ahụ gaa na otu Juventus ebe ọ ga-anọ ihe ruru afọ atọ dịka onye nkuzi otu ahụ.
Ọ ga-anọchị anya Miaximillano Allegri pụrụ na ngwụcha afọ a.