Chika Ike: O nweghị sakramenti jikọọ mụ na Ned Nwoko, di Regina Daniels

Chika Ike bụ ome ejije Nollywood ekwuola na o nweghị eiokwu dị na-akụkọ na-efegharị nke kwuru na ya na di Regina Daniel bụ Ned Nwoko na-eme enyi.

Kepukepu na-efegharị na soshal midia na-arụbu ya aka dịka ihe onyonyo fegharịrị na-egosi ebe onye yiri Nne regiina Daniel bụ Rita Daniels na-eti mkpu sị Chika ike hapụrụ nwa ya di ya.

Mana dịka otu onye ihe ya na-amasị jụrụ ya ma ọ na-ayị Ned Nwoko, Chika Ike zara n'aka Instagram si na o nweghị sakramentị jịkọrọ ya na nwoke ahụ nke ọlụlụ ọ lụrụ Regina Daniel n'afọ gara aga wuru ewu na soshal midia.

Cheta na abalị ole na ole gara aga na n ne Regina Daniel pụtara gọọ na ọ bụghị eziokwu ihe e kwuru na ya bụ ihe onyonyo ahụ fegharịrị ebe o kwuru nna ọ bụụ na Chika ahapụghị nwa ya na ya ga-agara ya ije na mụọ sị na ihe onyonyo ahụ bụ "a rụrụ arụ."

Regina Daniels: Alụọla m di

Regina Daniels atụnyere ndị ntị na-akọ ọkọ banyere ihe mere na ndụ ya nso nso azụ.

Cheta na Regina onye na-ewu na soshal midia kemgbe ọnwa atọ kwere nkwa ịkụwa akịoyibo Nsugbe.

N'ozi mgbaama dị n'ihe onyonyo o wepụtata na nsonso, ọ kpọrọ okwu aha kpomkwem sị n'ezie na kepukepu ahụ na-ewu banyere alụmdi ya bụ eziokwu.

Regina, onye aha Igbo ya bụ, Nneamaka, kwuru sị "Alụọla m di" dịka o wepụtara ọla aka dị ya n'aka tinye na mkpịsịaka nke so ọdụdụaka.

Ọ gara n'ihu zaa ndị na-ekwu na ọ bụ maka ego mere o jiri lụọ onye tọrọ ya mgba n'elu, mgba n'ala sị, "Obi na atọ m ka nnu ugbua n'ihi na ịhụnanay na-egbu m ka mmanya."

Ọ tụpụkwara egbe ntụnala dịka o kwuru na onye ikpeazụ o degara ozi n'ekwe ntị bụ Somadina.

Cheta na dịka akụkọ na ọ lụụ onye ndọrọrọndọọ ọchịchị ama ama bụ Ned Nwoko na-ewu, akụkọ na ọ gbahapụrụ Somadina bụ onye ọtụtụ na-arụ aka na ọ bụ enyi ya nwoke wukwara.

Akụkọ ga-amasị gị: