You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
State Police: 'Ka steeti niile nwe uweojii nke ha' - Ngalaba onyeisiala Buhari hibere maka SARS
Ngalaba onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari ehibere ka ha tinye anya n'ihe metụtara otu uweojii puruiche akpọrọ SARS ekwuola na ọ ga-adị mma maọbụrụ na steeti n'okpuru ọchịchị ime obodo dị iche iche na Naịjirịa ga-enwee uweojii nke ha.
Onyeisi ngalaba a akpọrọ "Presidential Panel" na Bekee bụ Maazi Tony Ojukwu bụ onye nyere Onyeisiala Buhari akwụkwọ nchọpụta ha sị:
"Anyi nwetere mkpesa otu narị iri na atọ na Naịjirịa maka mmegbu ndị mmadụ n'aka SARS, anyị nwetekwara atụmatụ iri abụọ na abụọ maka otu a ga-esi gbanwee ma dozie otu SARS na ndị uweojii niile."
Cheta na ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa nọbụ na-eti mkpu ka gọọmenti tinye anya na SARS, bụ ndị a na-ebo mpụ na mmegide mmadụ.
Ha ji akara #EndSARS na Twitter were na-akwado ka emegharịa SARS.
Na nnabata mpkebi nagalaba o hibere, onyeisiala Buhari kelere ha maka ọrụ ha rụrụ ma gakwa n'ihu nye iwu ka onyeisi ndị uweojii na ndị "National Human Rights Commision" (NHRC) ga-ahazie etu a ga-eji mezuo atụmatụ ewetere.
Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere Segun Awosanya bu onye eji atụmatụ #EndSARS mara, sị na nhazịgharị SARS na uweojii dị ezigbote mkpa:
Onye ọzọ bụ Immanuel Ibe-Anyanwu na onwe ya gwara BBC Igbo etu ndị SARS jiri wakpo ya: