You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra steeti: Ndị uweojii anwụchiela ndị yi uwe ndị agha Naịjirịa tọrọ mmadụ
Ndị uweojii nọ n'Anambra steeti anwụchiela ndị ntọ yi uwe ndị agha Naịjirịa wee tọrọ otu nwoke n'obodo Ekwulobia.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mohammed Haruna kwuru na otu n'ime ndị ntọ ahụ bụ onye otu ndị agha Naịjiria ma kwukwa na ha na-enyocha ya bụ mpụ ka ha mara ihe kpatara ya.
SERAP akpụpụla Gọvanọ Delta Ụlọikpe
Otu na-ahụ maka nhazi akụ na uba obodo akpọrọ SERAP n'ichafụ akpụpụla gọvanọ Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ụlọikpe maka ọnọdụ ọjọ ụlọ akwụkwọ primari dị na steeti ahụ dị.n
Ha chọrọ ka ụlọikpe ukwu nke gọọmenti etiti gwa Okowa ka ọkọwa ihe kpatara ọnọdụ ụlọakwụkwọ ndị ahụ ji dị njọ
N'ofesi,
Ụlọikpe dị n'Iraqi amaala ụmụnwoke atọ si mba French ikpe ọnwụ ka ha chọpụtachara na ha so n'otu Islamic State ndị agụnyere dịka ndị omekome.
Ha bụ ndị mbụ a na-eche na ha so n'otu IS amarala ikpe ọnwụ.
Okwu Naịjirịa na IAAF
Minista na-ahụ maka egwuregwu na Naijirịa bụ Solomon Dalung agwaala BBC Igbo na agbanyeghị akụkọ na-efegharị gbasara ego 'International Associations of Athletics Federation kwụfere AFN sị dị,
na gọọmenti etiti ga-agbapụtarịrị onwe ya.
O kwuru na nke a bụ maka mmekọrịta dị n'etiti ha na ndị IAAF.
O kweghị ka onye ntaakụkọ BBC gbacha ya ajụjụ ọnụ dịka ọ pinyuru ekwenti ya.
Nkeji
Ihe nkiri