Night runners: 'Ịta amusu dị n'agbụrụ ezinaụlọ anyị'
Ndị mba Kenya akọọla akụkọ ifo banyere ndị na-ata amusu n'ọtụtụ ọgbọ mana ha amaghị ma akụkọ a ọ dị ire.
A sị na ndị na-ata amusu bụ ndị mmụọ ọjọọ bara n'ime ha mana amaghị ndị ha bụ.
Onye ntaakụkọ BBC Africa Eye bụ Tom Odula mere nyocha ma chọpụta na ịta amusu dị ire ma chọpụtakwa otu ezinaụlọ na-ata amusu.
Ihe onyonyo a nke o mere setere ndị na-ata amusu dịka ha nọ n'ihu ọrụ ịta amusu.
Biko marakwa na enwere foto ndị na-adịchaghị mma ile anya.


