UK akwadola Naịjirịa n'ụzọ siri ike imegide ndị oyindụegwu

Jeremy Hunt bụ onye odeakwụkwọ na mmekọ mba Briten bịara njem nleta ndị agha Naịjirịa na mpaghara uwgu Naịjirịa.

Ọ bịbịa ya gosiri na mba UK ka kwụsị Naịjirịa ike n'ọgụ megide otu ndị oyindụegwu gụnyere Boko Haram.

N'ozi o ziri ndị agha na Maiduguri, Jeremy Hunt si "ndị omekome a achụpụla ndị mmadụ na bee ha.."

"Boko Haram na otu ndị ọzọ yiri ya bụ mmehie n'ihe anyị jiri biri nke mere na mba Briten ga na-enye Naịjirịa nkwado ịmegide ha" ka o kwuru.

Mba Briten enyela Naịjirịa ihe ruru £300m n'afọ ise ma zụkwaa ihe ruru ndị agha 30,000 maka agha ebusoro Boko Haram.

Akwụkwọ njikọ aka nke onyeisiala mba abụọ a binyere aka na ya n'afọ 2018 ga-awulite ụsoro enyemaka nke Briten na-enye Naịjirịa.

Na Katsina,

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Katsina steeti bụ Gambo Isah akwọpụla aka ya n'akụkọ na-efegharị na ọ nwụchiri ndị echere tọrọ ogo nwoke oney nche onyeisiala bụ Muhammadụ Buhari

Ọ kọwara na akụkọ ahụ nwereike ịpụta site na nghọtaghịe.

Igbo nọ mba ndị ọzọ,

E meela Ernest Ezeajụghị Mayor obodo Brent nke dị n'isiobodo mba Briten bụ London.

Maazị Ezeajụghị nke kwagara mba Briten n'afọ 2004 ga a bụ onye isi ojii mbụ ga-anọ n'ọkwa Mayor ahụ.

Na mba ofesi,

Ụlọụka Katọlịk n'ala Sri Lanka akagbuola ekpere ụbọchị ụka nke bụ Mass na Bekee maka kepu kepu a nụrụ na a na-akwado ịgba ogbunigwe n'ebe ahụ ọzọ

Cheta na ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka nwụrụ n'ụbọc hị Ista mgbe a gbara ogbunigwe n'ụka ahụ.

N'egwuregwu,

Ndị na-akwado ọgbọsọ a ma ama bụ Caster Semenya arịọla ya sị ya alala ezumike nka maka ikpe mkpesa ya akagburu ụnya ahụ.

Nke a bịara dịka o weputara ụfọdụ ozi n'akara Twitter ya na-ekwu maka ị wụsa ngwa ọgụ.

BBC Igbo na nkeji