Onye bụ 'Mrs Churchhill' mere ka ụwa kpụrụ Tonto Dikeh n'ọnụ ugbua?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụmụ Naịjirịa nọ n'elu twitter na-aja Tonto Dike ike ka Churchill bụbụ di ya depụtachara ozi ebe ọ kpọrọ nwaanyị ọzọ "Mrs Churchhill."

Olakunle Churchill degara onye na-eme ihe nkiri a na-akpọ Rosy Meurer ekele maka ụbọchụ ncheta ọmụmụ ya ma tinye 'Mrs Churchhill' na ngwụcha ekele ahụ.

Nke a mere ka ụmụ Naịjirịa kwuwe na ha chetara mgbe Tonto Dikeh kwuru na Meurer na-etinye anya n'ebe di ya Churchhill nọ mgbe ha na-alụ di na nwunye.

Ụfọdụ kwuru na ozi a egosila na ya bụ Churchhill na Meurer na-ayịbu dịka Tonto si boo ha na mbụ.

Lee ụfọdụ okwu ha depụtara.

Cheta na Tonto na Olakunle lụrụ di na nwunye n'afọ 2016 ma gbaa alụkwaghịm n'afọ 2017.

Ihe Churchill sara ebubo Tonto boro ya

Ọtụtụ ndị a ma ama na-eme ihe nkiri ekwuputela uche ha gbasara ihe Tonto Dikeh kọwara ndị ntaakụkọ maka di ọlụbụrụ.

Churchill bụ di ọlụbụrụ kwuru na ọ bụ amara na-eche ya ma nwekwa obi ekele.

Nke ndị mmadụ sonyere n'ụtụtụ a bụ ọzọ na-akpọtụ n'etiti Tonto na Ik Ogbonna bụkwa onye na-eme ihe nkiri

Ik Ogbonna gwara ya n'elu instagram na tupu o mee ihe ọ bụla n'elu soshal midia ya cheta nwa ya nwoke.

Lee ihe Tonto sara ya:

@renoomokri kwuru na ọdịghị mma ka mmadụ na-ekwucha ihe ọjọ niile ọ ma maka di ọlụbụrụ maọbụ onye ọyịbụrụ.

Funke Adesiyan sokwa na ndị manyere ọnụ n'okwu a mana ndị mmadụ pụtara katọọ ya.

A mabeghị mgbe okwu a ga-ebi mana anyị ka nọ ma na-ewetere ụnụ ka o si gaa.

Akụkọ ga-amasị gị: