Imo Elections: "Aga m agbaghara APC mmehie ha megidere m na ntuliaka 2019"

Ọ gwara BBC n'ekwentị na ihe na-esere ya na otu APC bụ na ha nyere onye ọzọ ikike ịzọ ọkwa Gọvanọ.

Nwosu kwukwara na ọ gaghị ahapụ otu ya banye otu ọzọ n'ihi na APC nwere onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha ha.

Ọ sị "anọ m n'otu ebe m zọrọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka gara aga".

Ọ dọrọ ndị nso ya aka na ntị sị ha na obi adala ha mba n'ihi na ọ ga-agbagha mpụtara ntuliaka e mere n'Imo.

"Nkwa m na-ekwe ha ndị na-eso m bụ na oge adịghị anya, anyị ga-enweta ọchịchị ruru anyị n'ihi na ọ bụ chineke na-enye ọchịchị"

O kwukwara na mmeri Emeka Ihedioha megidere iwu Naijira nke dị n'akwụkwọ iwu.