You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Father Clement Ugwu: 'Ndị ụka Kristi enweghi olileanya na nchekwa Naịjirịa' - Bishop Odedeji
Bishop ndị ụka Anglịkan na mpaghara ọdịda anyanwụ Legọs bụ James Olushola Odedeji akatọọla ọnwụ Fr. Clement Ugwu.
O kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ nke mere na ndị ụka kristi enweghizi olileanya na nchekwa ala Naịjirịa.
O kwuru nke a mgbe ọ gara ụka mmamma a tụrụ maka ụkọchukwu nọ n'okpuru ya nwunye ya gbalahụrụ ọnwụ site n'ihe mberede ụgbọala.
O kwukwara na ọ dị mwute na o nweghi ihe ndị ọchịchị na-eme gbasara oke mwakpo, ntọrọ nakwa ohi na-arị ibe ya elu na Naịjirịa.
"Ndị ụkọchukwu dị ka ndị ọrụ enyemaka, ha ekwesighi ịgabiga ụdịrị ihe ọjọọ a" ka ọ gwara BBC Igbo.
Cheta na ndị ntọ gburu Clement Ugwu n'Enugwu n'agbanyeghi na ezinaụlọ ya na-akwụ ego mgbapụta ha sị ha kwụọ.
Akụko ndị ọzọ ga-amasị gị