Cyclone Idai: Ihe egwu sochiri oke idemmiri a

Ebe foto si, AFP
Oke idemmiri nke Bekee kpọrọ 'Cyclone Idai' ebutela arịrị na mpaghara ndịda Afrịka.
Mba ndị ọ kachasị metụta bụ Mozambik, Malawi na Zimbabawe ebe o gburu ihe karịrị mmadụ narị ole na ole.
N'agbanyeghị na o ruola otu izu kemgbe ọdachi a bidoro, ndị ọrụ gbatagbata na-adọ aka na ntị na ihe jisike aka njọ maka ihe ndị a:
1. Idemmiri
O ruola otu izụụka kemgbe ya bụ ifufe mmiri malitere ịdọsasị ọtụtụ obodo Beira na Mozambik.
Mana egwu dị n'ihi na mmiri ka na-ezo ebe ndị ọrụ enyemaka na-eti mkpu.
Ha na-ekwu na obodo ahụ niile nwere ike ịmịkpu n'ala.

Ebe foto si, EPA
Osimiri abụọ ekwofela ikperemmiri ha na mba Mozambik, ebe otu osimiri mekwara otu ihe ahụ na mba Zimbabwe.
2. Afọ ọsịsa (Cholera)
Ọ bụrụ na ọrịa afọ ọsịsa banye n'okwu a, ọtụtụ ndị mmadụ ga-anwụ.
Ọrịa ahụ na-efegharị site na nsị ịbanye na mmiri ọṅụṅụ nke ndị mmadụ na-aṅụ

Ebe foto si, EPA
Oke idemmiri ahụ abụghị nsogbu, ọ bụ n'ihi na ọ gbarụọla ebe ndị mmadụ si achọta mmiri ha na-aṅụ.
"Ọ bụ okwu anyị na-eche ka o welite isi," bụ ihe Paolo Cernuschi kwuru.
Paolo Cernuschi bụ onye nchịkọta otu 'International Rescue Committee' so ahụ maka enyemaka na ma ahụ.
Ọrịa ndị ọzo dịka taifọd nakwa nwanne ya bụ ịba(Malaria) so na ọrịa ndị na-enye ndị ọrụ enyemaka isi ọwụwa ebe ha na-agbagharị ịgbochi ya
3. Oke Agụrụ
Ebe ụfọdụ nri ndị ọrụ gbatagbata na-enye ndị mmadụ nwere ike ịgbochi agụrụ n'izuụka ole na ole, ọ pụghị ịkwụsị ya n'ọdịnihu.
Cernuschi kọwara na ụkọ nri dị n'ala ahụ tupu oke ifufe mmiri a abịa mebie ihe.
O kwuru na obere ihe ndị akara ahụ kọọ n'ugbo ugbua anaala na mgbuka.
Cernuschi kọwara na, "Ụkọ nri na oke agụrụ a nwere ike iru ọnwa isii maọbụ otu afọ."












