Governorship Election 2019: Kedụzịa ndị tụrụ vootu n'izuụka abụọ gara aga?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka a na-eme ntulika nke ọkwa Gọvanọ na nke ụlọomeiwu steeti dị icheiche, ihe dị iche dị.

Ndị ntaakụko BBC n'ebe niile n'ala Igbo na-ajụ otu ajụjụ; ndị mmadụ apụtaghị mee ntuliaka.

N'ụfọdụ ebe, ndị mmadụ apụtaghị chacha, n'ebe ndị ọzọ mmadụ ole na ole pụtara ime ya bụ ntuliaka.

N'Enugwu, ndị ntoroọbia gbaghapụrụ ntuliaka ịga gbaa bọọlụ na egwuregwu ndị ọzọ

Ọ bụkwa ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ n'Igwe soshal midia dị icheiche.

Iyke kwuru na ọ bụ makana ndị mmadụ enweghizi olileanya na ngalaba Inec.

Emeka bi na Yaba, Legọs kwuru na onweghi ndị a hụrụ anya cha cha.

Ebe Imoh na-akọwa ahụmihe ya n'ọgbọ ntuliaka ya .

Nke mere na ụfọdụ ndị a ma ama dịka Ramsey Nouah tinyere ọnụ n'okwu a.

Ọ bụ okwu ego?

Ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka na enweghi ego a na-ekesa nadị mmadụ dịka e mere na ntuliaka ọkwa onyeisiala.