Election 2019: Ndị nnukwu mmadụ gbahapụrụ PDP gbaso APC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisiala Muhammdu Buhari ekwuola na ndị otu PDP ka nwere okwu ịza gbasara mmefu ego mgbe ha nọ n'ọchịchị.

N'ọnụ ya "PDP akọwabeghi ihe ha ji ego mee n'afọ iri na isii ha nọ n'ọchịchị".

O kwukwara "O nweghi ihe anyị hụrụ mgbe anyị batara n'ọchịchị n'afọ 2015".

Mana enwere ụfọdụ ndị nọ n'APC ugbua si otu PDP ahụ chịrị afọ iri na isii, mabata.

Ndị nọ n'otu APC ugbua si n'otu PDP mabata

  • Rotimi Amaechi

Ọ bụ aka chịrị Rivas steeti ugboro abụọ n'okpuru PDP site n'afọ 2007 rue 2015.

Ugbua ọ bụ Minista na-ahụ maka njem n'okpuru APC.

  • Orji Uzor kalu

Ọ chịrị Abia steeti dịka Gọvanọ site n'afọ 1999.

Ugbua o meiriri oche n'ụlọomeiwu ukwu n'okpuru otu APC.

  • Rochas Okorocha

Obasanjo mere Okorocha onye ndụmọdụ pụrụiche n'ihe gbasara otu ndọrọndọrọ n'afọ 1999.

Ọ mechara siri na PDP fere na APGA tupu o si ebe ahụ gbafee n'APC.

Ka ọ dị ugbua, a ka na-enyocha ma ọ zọtara oche n'ụlọomeiwu ukwu na ntuliaka gara aga, ka ọ bụ na ọ zọtaghị, makana onye nchịkọta vootu na mpaghara ya kwuru na ọ manyere ya ka ọ kpọọ aha ha dịka onye meriri, n'ike.

  • Chris Ngige

Ngige chịrị Anambra mgbe o meriri ọkwa Gọvanọ n'okpuru PDP, n'afọ 2003 ruo 2006.

Ugbua ọ bụ Minista na-ahụ maka ọrụ na iwulite ngalaba ọrụ.

  • Godswill Akpabio

Godswill Akpabio chịrị Akwa Ibom steeti site n'afọ 2007 rue afọ 2015.

Ugbua ọ zọrọ ọkwa sinetọ n'okpuru APC.

  • Nasir El Rufai

Chịrị isi obodo Naịjirịa dịka Minista na-elekọta ya n'okpuru PDP.

Ugbua, ọ bụzị aka na-achị Kaduna steeti.

  • Umar Ganduje

Ọ nọbu n'otu PDP dịka osote gọvanọ na-achị Kano steeti.

Ugbua, ọ na-achị steeti ahụ n'okpuru APC.

  • Audu ogbeh

Audu Ogbeh bụbu onyeisioche otu PDP n'ala Naịjirịa niile mana ọ hapụrụ ọkwa ahụ gbalaga na APC.

Ọ bụzi Minista na-ahụ maka ọrụ ugbo n'ala Naịjirịa niile.

  • Udoma Udo Udoma

Ọ nọchịrị anya Akwa Ibom Saụt n'ụlọomeiwu ukwu site n'afọ 1999 rue afọ 2007.

O jizi ọkwa minista na-ahụ maka bọjetị na ịhazi ihe na Naịjirịa .

  • Heineken Lokpobiri

Ọ bụbu sinetọ na-anọchi anya Bayelsa West site n'afọ 2007 rue 2015 n'okpuru PDP.

Ugbua, o ji ọkwa minista na-ahụ maka ọrụ ugbo nke steeti.

Ndị ọzọ bụ

  • Victor Ndoma-Egba
  • Solomon Lalong
  • Bello Masari
  • Abiola Ajimobi
  • Isa Yuguda
  • Ali Modu Sheriff
  • Ita Enang
  • Kashim Shettima
  • Aliyu Wamakko
  • Segun Oni
  • Adamu Aliero
  • George Akume
  • Danjume Goje
  • Atiku Bagudu
  • Ita Enang
  • Adamu Mu'azu
  • Sani Daura

Akụkọ ga-amasị gị: