Lagos Election: Ntuliaka 2019 ọ na-akpalite ịkpa oke agbụrụ?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ntuliaka e mere n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Febrụwarị kpalitere okwu agbụrụ na Legọs.

Kemgbe ọgbaghara metụtara ndị Igbo bi na Okota na Aguda dapụtara na ntuliaka ọkwa onyeisiala ahụ, ụfọdụ mmadụ ekwuola okwu megide ndị Igbo na Legọs.

N'afọ 2015, Ọba Legọs bụ Rilwan Akiolu, gwara ndị Igbo na a ga-atụnye ha n'oke osimiri ma ọ bụrụ na ha atụnyereghi onye ọ na-akwado na ntuliaka ahụ.

Mgbe Onye zọrọ ọchịchị n'okpuru PDP mgbe ahu malitere ịchụ nta vootu nke 2019 a, ọ bulitere akụkọ ahụ n'ụdị ụfọdụ mmadụ si na ọ bụ iji kpalite iwe ndị mmadu kefụrụ.

Ụdịrị ihe ahụ welitere isi ọzọ na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2019, mgbe ụfọdụ ndị Igbo kwuru na e gbochiri ha ịtụ vootu gwa ha "laghachi n'ala Igbo" gaa tụọ vootu.

Onye ọzọ kwuru ka ndị Igbo kwụsị itinye ọnụ n'okwu ndọrọndọrọ n'obodo ndị ọzọ na-abụghị mpaghara ọwụwa-anyanwụ.

N'ụbọchị Monde so ụbọchị ahụ, ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n'ala Igbo gwara BBC Igbo na ndị agboro bịara kwapịa ọdọahịa ha.

Ihe ndị a kpalitere okwu "Onye nwe Legọs?", n'etiti ndị Igbo na ndị Yoroba, ọkachasị n'elu soshal midia.

Mana e nwere ndị na-akwado ndị Igbo, na-ekwu sị kwụsị ikpaso ha oke.

@Olushola_shola kwuru sị na ndị Igbo sokwa nwee ọnụ n'ime ala ndị Yoroba.

@Bombay_005 kwuru sị na nwunye ya bụ onye Igbo, na o soghi na-asị ndị igbo "kwapụ-kwapụ".

@KAdebakin kwuru sị na ndị Igbo ebiela n'ala ndị Yoroba ihe karịrị afọ narị.

@omotourlar kwuru na ọ bụ ndị Igbo na-eweta ọkụ n'ala ha.

@bolanle_cole kwuru na ndị Igbo bụ ezigbo uru nye ndị mpaghara ọdịda-anyanwụ.

Ka okwu a na-aga n'ihu, ụfọdụ ụmụafọ Igbo tinyere ọnụ wee na-akọwa na ọ bụghị eziokwu na ndị Yoruba na akpasị ndị Igbo oke agbụrụ na Legọs.