Kevin Hart: Lee ka omenka si jiri nka gbanwee ndụ ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Eli Waduba, nwa amadi Naijiria Kevin Hart zuru esere o sere na Twitter, ekwuola na 'aka Chukwu dị ya'.

Waduba, onye na-ese ihe ọ dịka foto, sere Kevin Hart bụ onye ọkpaọchị mba Amerịka a ma ama, were ya tinye na Twitter sị ndị mmadụ kesaa ya na ya chọrọ ka Hart hụ ya ma kwalite ya n'ọrụ nka ya.

Hart hụrụ ya bụ ozi ma kwe nkwa ịzụ ya nakwa ịkwụ ya ụgwọ ka o sere ya ndị enyị atọ ana anụ aha ha ka.

Ugbua ihe mere atụnyere ọkụ na Twitter dịka ọ ghọrọ akụkọ na-ewu ebe niile.

Na nkọwa ihe mere,Wadụba ekwuru na ọ bụ aha ya bụ 'Shekwonuwaduba' nke pụtara "Chukwu na-awara m ụzọ" na-eso ya.

Kemgbe akụkọ ahụ pụtara, ọtụtụ mmadụ na-anụrịrị Waduba.

@_valkiing kwuru na ya zipụrụ ozi akpam ọchị maka Buhari na ọ hụghị ya ma ya fọdụ izụ ya.

Mana Waduba n'onwe ya gwara ụlọ ntaakụkọ CNN na etu ihe a siri mee bụ ihe tụrụ ya anya.

O kwuru na o nwere olileanya na ọ ga-eme mana ọ maghị na ọ ga-eme na nsonso a

Akụkọ ndị ga-amasị gị: