You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigeria Election 2019: Kedụ ihe e ji higharịa ntuliaka n'ime abalị? - Oshiomhole
Akụkọ dị mkpa:
Na nzukọ Inec na ndị isi a hụrụ kwaba okpu nwere gbasara nhigharị ntuliaka, ha kwuru na ha adọtịghị ntuliaka a maka pati ọbụla, kama na ọ bụ makana ngwaọrụ ha agazubeghi ebe niile o kwesịrị irute, na ha ga-agba mbọ hụ na o mere tupu Satọde eruo.
N'ime otu nzukọ a,
Onyeisioche otu pati APC bụ Adams Oshiomhole, jụrụ ajụjụ sị "kedụ ihe mere e ji chere ka o ruo elekere abụọ nke isi ụtụtụ mgbe ndị mmadụ labachara ụra, tupu e wee higharịa ntuliaka a?"
Ọ gwakwara Inec sị ka ha rịọ ndị mmadụ mgbaghara maka mmehie a ma kọwakwaa ihe merenu ọfụma.
Peter Obi na-azọ ọkwa osote onyeisiala, gwara BBC Igbo na ihe na-ewute ya maka nhigharị Inec yigharịrị ntuliaka a, bụ na ndị mmadụ mefuchara ego nakwa gbuo oge ha.
N'ofesi,
Otu nwoke a kpọrọ Gary Martin, gbagburu mmadụ ise n'ụlọọrụ ya n'Aurora dị n'obodo Chicago makana a chụrụ ya n'ọrụ.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, tinyere okwu nkasiobi gbasara ya n'ịntanetị
Ebe a gụpụtara mmadụ itoolu na-ezo ezo egwu ala na mba Zimbabwe ka ụbọchị anọ mmiri tojuru ebe ha na-egwu ala gachara.
N'egwuregwu,
Ndị enyi na ezinaụlọ Emiliano Sala bụ ọgbabọọlụ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'ọnwa Jenụwarị, zukọrọ maka olili ya na mba Ajentina.
Agbaguru onye otu pati na Delta:
Kọmịshọna ndị uweojii na Delta steeti bụ Adeyinka Adeleke gwara BBC Igbo n'ekwentị na agbagburu onye ahụ n'ezie.
O kwuru na dịka ọ dị ugbua na amabeghi ihe kpatara ya bụ mgbagbu maọbụ ihe ndọrọndọọ maọbụ ihe ọzọ
Mana o kwuru na a na-eme nyocha ọnwụ Ngozi Ijei iji ma ihe mere.
Ngalaba na-achịkọta ihe gbasara ntuliaka na Najirịa bụ Inec adọtịala ụbọchị ekwesiri ịme ntuliaka ọkwa onyeisiala,nke ndị ụlọomeiwu nakwa nke ndị ọkwa gọvanọ.
Ụbọchị ọhụrụ ha wepụtara bụ ụbọchị 23 n'ọnwa Febụwarị maka nke onyeisiala nakwa ụbọchị itoolu n'ọnwa maachị maka nke ndị gọvanọ.
N'otu aka ahụ ụmụ Naịjirịa ọ kachasị ndị na-efe ala nna ha ebeela akwa arịrị maka ndọtị a adọtịrị ntuliaka.
Ụfọdụ na-ekwu na ha amuchihi anya kemgbe abalị ụnyaahụ ebe ha na-eche ọrụ Inec ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ na mbara ka ha hiri ụra ebe ha na-eche ka ntuliaka bido.
Na mba ofesi,
Ndị uweojii n'obodo Aurora dị n'Illinois kwuru na mmadụ ise anwụọla n'otu ụlọọrụ dịka otu n'ime ndị malitere ịgba ndị otu ya egbe.
Ndị uweojii ahụ kwukwara na agbagburu onye ahụ dịka ya na ndị uweojii na-akwaa mgbọ na mba Amerịka.
N'Egwuregwu,
Otu Flying Eagles nke Naịjirịa ga-ezute Amajite nke mba Saut Afrịka iji maata mbe na abọ nke bụ oke n'asọmpị iko mba Afrịka na-eme ugbua.