You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Esha Gupta edegarala Iwobi akwụkwọozi mgbaghara maka ịkpọrị ya
Esha Gupta, onye ihe nkiri India, arịọla onye egwu bọọlụ Alex Iwobi ka ọ gbaghara maka ịkpọrị ya.
N'akwụkwọ ozi mgbaghara o dere, Gupta kwuru na " O wutere m nke ukwu agwa m mkpara na Fraide gara aga. E nweghị m ike ịkọwali etu ihe mere siri mejọọ gị."
O rịọkwara otu egwu Arsenal mgbaghara ma kwe nkwa ya agaghị akpa n'ụdị agwa ahụ nke metụtara ikpa oke agbụrụ ọzọ.
N'izu gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ n' ụwa niile katọrọ Esha Gupta bụ onye na-anọchite otu Arsenal (brand ambassador) maka ịkparị nwa afọ Igbo na-agbara Arsenal Bọọlụ bụ Alex Iwobi.
Gupta, onye ihe nkiri India ama ama kpọrọ Iwobi 'nke ahụ dị ihu ka ọzọdịmgba.'
Gupta mechara rịọ mgbaghara sị na ya amaghị n'okwu ya gosiri ịkpa oke agbụrụ, ma wepụ okwu ahụ n'elu igwe ịntanet.
Mana ọtụtụ ndị mmadụ anabataghị arịrịọ ya.
@babuyagu kwuru na okwu ya egosighị n'ezie n'ihe Gupta mere wutere ya.
Ụfọdụ kporo oku ka a mabido ya.
Ka ọ dị ugbua ma Iwobi ma Arsenal enwebeghị ihe ha kwuru maka okwu a.
Otu onye dị Iwobi n'ahụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na Iwobi nweghị okwu ọ ga-asa nwata nwaanyị ahụ.
Ọ gara n'ihu sị na Gupta maghị ihe ọ na-ekwu.
" Ihe ka mma ime ụdị ya bụ ịgba ha nkịtị."