CJN Onnoghen: Ọkaikpe Muhammad eduola ndị otu ngalaba mkpesa ntuliaka 250 n'iyi ọrụ
Akụkọ dị mkpa

Ebe foto si, Aliyu Tukur
Ọkaikpe ukwu Naịjirịa were n'ọrụ ịnọchịte anya Walter Onnoghen bụ Ibrahim Tank Muhammad, eduola ndị ga-anọ n'isi ikpe ntuliaka n'iyi ọrụ.
Atụmatụ a bu ihe Onnoghen na-ahazi ime taa bụ ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Jenụwarị 2019, tupu Onyeisiala Muhammadu Buhari achụpụ ya n'akụkụ maka ebubo na ọ dara iwu.
Ndị eduru n'iyi ọrụ bụ mmadụ 250, nke onyeisi na ndị nkwado so n'ime ha.
Nke a n'abịa ka ụlọ mmekọrịta Amerịka na Naịjirịa dị n'Abuja dere na etu Onyeisiala Buhari si wepụ Onnoghen na-ama ha obi jijijji.
Ha sị ka Naịjirịa mee ihe etu o kwesịrị maka okwu a, ma mekwa ya ọsịsọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'otu aka ahụ, n'agbanyeghi na Nigerian Bar Association katọrọ mwepụ Onnoghen, ọkammụta Itse Sagay ekwuola na Buhari nwere ikike ime ihe o mere.
Sagay sị na Onnoghen dara iwu, ma kweta na ya dara iwu, nke mere na o kwesịghịzị ịnọ n'ọkwa dịka ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa.
Nnia Nwodo sị ka ntoroọbịa kaa obi

"Ndị ntoroọbịa ụwa ọhụrụ adịghịzị aka obi ka ndị gboo"
Onyeisi Ohanaeze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere.
Ọ kọwara na ndị chịrị Igbo na gboo na-ebido n'okoroọbịa ahazi makwa chịa obodo dịka Nnamdi Azikiwe na ndị ọzọ siri mee.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Naomi Osaka akwụrụla dịka eze ka ọ pịapụrụ Petra Kvitova maburu iko n'asọmpi tenis bụ Australian Open.
Cheta na Osaka bụzị onye mbụ na tenis ugbua, pịapụkwara Serena Williams n'asọmpi US Open n'afọ gara aga.
Atiku, Saraki na PDP akatọọla Buhari

Ebe foto si, @Atiku
Mkpọtụ ka na-ada banyere nwezuga onyeisiala Muhammadu Buahri mere Ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Walter Onnoghen.
Onye na-azọ ọchịchị n'okpuru PDP bu Atiku Abubakar katọrọ atụmatu ahu ma kwuo na o na egosi aka ike. PDP na onyeisi ndi omeiwu naijiria bụ Bukola Saraki sokwa katọ nnapu ọkwa a emere Ọkaikpe Onnoghen.
PDP gara n'ihu kwuo na ha ga-akwụsị achụmnta vootu ruo abalị abụọ iji gosi iwe ha maka ihe mere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Pati Moghalu na Durotoye abịakọtala ọnụ

Ebe foto si, @ANNigOfficial
Mmadụ abụọ na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Kingsley Moghalu na Fela Durotoye ekwekọrịtara na ha ga-anyukọ mamịrị ọnụ ịhụ na ọgbara ụhụhụ ga-enye ha ihe ha na-achọ.
Ozi a si n'Ọnu onye na-ekwuru pati YPP bụ Bishop Amakiri na nke ANN bụ Emmanuel Dania sị na ha abịakọtara iweputa atụmatụ ha kpọrọ THE Force.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Trump ekwerela ka ụlọọrụ gọọmenti Amerịka gbapee

Ebe foto si, EPA
Ụlọ ọrụ gọọmentị agbapela na mba Amerịka ka omere ụbọchị iri ato na atọ onyeisiala Trump na ndi omeiwu bidoro ndọrọndọrọ ego o chọro ka eji rụọ mgbidi na oke ala ha na mba mexico.
Mgbape bịara n'azụ ulo omeiwu ukwu nake obele binyere aka n'iwu ga-enye ohere ka enwete ego a ga-eji kwuo ndi ọrụ ụgwọ.
Sanchez dị ọkụ ụnyaahụ

Ebe foto si, Getty Images
Alexis Sanchez lagachiri ama egwuregwu ọ nọbu mgbe Manchester United na Arsenal zutere ụnyaahụ.
Agbanyeghị na ndi na-akwado Arsenal na-akwa ya emo, Sanchez gbapere goolu na asọmpị ahụ Man U ji ọkpụ goolu atọ asatara ọtụ si Arsenal ka nụ.











