You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chief Justice of Nigeria: Buhari achụọla Okaikpe Onnoghen, nye Tanko Muhammad ọkwa
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu Onyeisiala Muhammadu Buhari chụpụrụ ọkaiwu ukwu Naịjirịa eboro ebubo na-okwughi ego dị n'ulọ akụ ya.
Onye dere maka ihe a bụ onye enyemaka Onyeisiala Buhari na soshal midi bụ Bashir Ahmad.
Akara Twitter onyeisiala mechara dee na Ọkaikpe Ibrahim Tanko Muhammad anụọla iyi ọrụ iji nọchite anya Onnoghen.
Ọkaikpe Tanko ga-anọdụ ruo mgbe onye ọzọ ga-apụta dịka Ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa.
Amụrụ Tanko Muhammad n'afọ 1953 n'obodo Doguwa ndị n'okpuru ọchịchị ime obodo Giade di na Bauchi Steeti.
Ihe a Onyeisiala Buhari mere emela ka ọtụtụ mmadụ na-ekwu okwu na social media.
Ụfọdụ sị na ihe a Buhari mere abụghị ihe iwu Naịjirịa kwadoro.
Ụfọdụ, dika aka na-achi Kaduna steeti bu Nasir El-Rufai, na-akwado ya.
Ndi ọzọ na-ajụ ma Onyeisiala Naịjirịa onwere ikike ịchụ Ọkaikpe ukwu mba ahụ.