Obasanjo: Ị nwere ike zuo Naịjirịa niile ga-iru ma ọ bụrụ na ị bụ onye APC

Na mkparịtaụka ya na BBC Yoruba nwere, onye bụbụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kwuru maka onye bụbụ osote nakwa onye na-azo ọchịchị na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 bụ Atiku Abubakar.

O kwukwara maka Boko Haram nakwa Independence National Electoral Commission (INEC).

Obasanjo kọwara na ya kwenyere na Onyeisiala Muhammadu Buahri ka Atiku njo, bu ihe mere ya jiri rapụ ikwado ndi ntoroọbịa n'ime mmadụ 73 na-azọ oche onyeisiala Naịjirịa.

O kwukwara ihe mere tupu ndị agha wakpo obodo Odi n'afọ 1999, bụ mgbe ihe ruru mmadụ 2500 ndị obodo nwụrụ n'aka ndị agha.

Mkparịtaụka a ga-apụta n'uju eche bụ ụbọchị nke 22 nke ọnwa Janụwarị 2019.