BBCGovDebate: 'Obi adịghị anyị mma maka ndị abịaghị' - Onye Imo

Aha onyonyo, ihe ndi mmadu kwuru maka nrụrịta ụka BBC

Igbo juru n'Owere mgbe BBC Igbo mere nrụrịtaụka nke ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steetị mana ọ bụ ihe tụrụ ndị Imo n'anya na naani otu onye n'ime mmadụ anọ kwesre BBC Igbo nkwa na ha ga-abịa nrụrịta ụka ahụ bụ ihe bịara ya.

Ndị a tere ndị Imo ụnyị n'ihu bụ Emeka ihedioha PDP, Hope Uzodimma nke APC na Ifeanyi Ararume nke APGA.

Onyeisi BBC Igbo bụ Adline Okere sị na ọ bụ sọọsọ Ararume bụ onye gwara ya na ya nwereike ghara abịa maka na ya na-amalite achụm nta vootu ya.

Ya bụ emume bidoro ka o ji ọkara gacha elekere abụọ n'ehihe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: