#Ekitimourns: Gwongworo akwọpiala mmadụ 12 n'Ekiti - Ndị uweojii

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii nọ n'Ekiti steeti agwaala BBC etu gwongworo si gbuo mmadụ ruru iri na abụọ ma merụọ ụfọdụ mmadụ ahụ n'Iworoki dị n'Ekiti steeti.

Ọnụ na-ekwuchitere ndi uweojii na steeti ahụ bụ Caleb Chukwu kwuru na ya bụ ihe mberede mere n'elekere itoolu n'ọma nke mgbede satọde gara aga bụ Jenuwarị iri na abụọ.

O kwuru na ụgbọala ahụ kụrụ ụgbọala Camry wee gbaba n´ụgbọala ọzọ bu ndị mmadụ kwọgbuo ha ma gbabakwazịa n'otu ụlọ dịketere ụzọ.

O kwuru na ya bụ gwongworo bu osikapa mana o nweghị ike ịkọwa onye nwe ya.

Ndị nzọpụta nọkwa ebe ahu ugbua na-ahụ na ha zọpụtara ndị tọrọ n'okpuru ụgbọala ahụ.

Chukwu kwuru na e bugala ozu ndị nwụrụ anwụ n'ụlo ozu ma kpọgaa ndị merụrụ ahụ ụloọgwụ.

Otu onye nọ mgbe ihe a mere kwuru na ọ kara aka njọ maọbụrụ na ụmụakwụkwọ Mahadum Ekiti pụtara izụ ahịa makana ya bụ ahịa diketere nso ebe ha bi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: