You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#Ekitimourns: Gwongworo akwọpiala mmadụ 12 n'Ekiti - Ndị uweojii
Ndị uweojii nọ n'Ekiti steeti agwaala BBC etu gwongworo si gbuo mmadụ ruru iri na abụọ ma merụọ ụfọdụ mmadụ ahụ n'Iworoki dị n'Ekiti steeti.
Ọnụ na-ekwuchitere ndi uweojii na steeti ahụ bụ Caleb Chukwu kwuru na ya bụ ihe mberede mere n'elekere itoolu n'ọma nke mgbede satọde gara aga bụ Jenuwarị iri na abụọ.
O kwuru na ụgbọala ahụ kụrụ ụgbọala Camry wee gbaba n´ụgbọala ọzọ bu ndị mmadụ kwọgbuo ha ma gbabakwazịa n'otu ụlọ dịketere ụzọ.
O kwuru na ya bụ gwongworo bu osikapa mana o nweghị ike ịkọwa onye nwe ya.
Ndị nzọpụta nọkwa ebe ahu ugbua na-ahụ na ha zọpụtara ndị tọrọ n'okpuru ụgbọala ahụ.
Chukwu kwuru na e bugala ozu ndị nwụrụ anwụ n'ụlo ozu ma kpọgaa ndị merụrụ ahụ ụloọgwụ.
Otu onye nọ mgbe ihe a mere kwuru na ọ kara aka njọ maọbụrụ na ụmụakwụkwọ Mahadum Ekiti pụtara izụ ahịa makana ya bụ ahịa diketere nso ebe ha bi.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: