Falz Talk: Ihe jịkọrọ Falz na Fela

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Falz akpọnyela ọkụ na soshal midia ugbua maka egwu ọhụrụ o tiputere a kpọrọ 'Talk' nke na-ewu.

N'ime egwu ahụ o kwuru maka obodo Naịjirịa nakwa ihe ndị ndọrọndọrọ na-eme amasịghị ndị mmadụ.

Nke a mere na ụfọdụ ndị mmadụ atụnyerela ya na onye otiegwu megide gọọmentị bụ Fela Anikulapo-Kuti.

Dịka Major A siri kwuo, na ọ bụghị site n'uwe ka eji e ṅomi Fela

Chemical Boy kọwara na Falz kwuru uche ya na-eneghi onye ọbụla nya n'ihu

Lee ihe ndị jịkorọ Falz aha ya bụ Folarin Falana na Fela nke ndị mmadụ n'amaghị.

  • 1. Egwu

Ha na-eti egwu na-agba ndịọchịchị mmehie ha n'ihu. Fela gụrụ egwu dịka "Vagabond in Power" ebe Falz gụrụ "This is Nigeria".

  • 2. Ezenaụlọ ha

Ha abụọ si n'ezinaụlọ ndị welitere isi na Naịjirịa. Fela si n'ezinaụlọ Ransome-Kuti na-euw ewu ebe Falz si na nke Falana.

  • 3. Ejiji ha

Ejiri eyighi uwe elu ahụ mara Fela mana Falz emmela otu ihe ahụ n'ime egwu ya "This is Nigeria"

  • 4. Nne ha abụọ nwere "Funmi" dịka aha ha.

Aha nne Fela bụ Funmilayo Ransome-Kuti ebe nne Falz bụ Funmi Falana.

Ihe ọzọ jịkọrọ ụmunwaanyị a bụ na ha bụ ndị a ma ama dịka ndị na-alụ ọgụ maka oke ruru onye bụ "Activist" na Bekee.

Akụko ndị ọzọ ga-amasị gị