You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Forbes report: Ihe mere Naijiria jiri gbaa ọnyụpa n'obodo kacha mma na-azụmaahịa
Ụlọọrụ ntaakụkọ bụ Forbes nọọrọ ụbọchị Wenezde kwupụta Naijiria dịka otu mba kachasị gbaa ọnyụpa n'azụmahịa.
site n'inweta akara ọnụọgụgụ ya dị otu narị na iri (110) na mba ụwa, nakwa ndị nke iri na-anọ n'Afrịka.
Nke a bịara dịka ọgbatachara ndị nke atọ na mba Afrịka n'afọ 2018.
Mba ndị ọzọ bụ isi n'ihe ngụpụta a gụnyere United Kingdom (1), Sweden (2), Hong Kong (3), Netherlands (4), New Zealand (5) nakwa Canada (6).
Mba United States nwetara akara dị (17), ebe mba South Afịrịka gbara ndị nke mbụ na mba Afịrịka gbaa gburugburu.
Dịka otu Forbes siri kwuo, ihe nyere aka na ngụpụta a bụ nke ruru iri abụọ na ise gụnyere: ikikere ịnwe ngwongwo prọpati, imepụta ihe, ụtụ isi, nka n'ụzụ, mpụ, nnwere onwe, ogogo obibi ndụ, ndị ọrụ, ihe eji ebi ndụ nakwa ndị ọzọ.
N'okwu ya oge BBC Igbo kpọtụụrụ ya n'ekwe ntị, onyeisi na ngalaba (Banking and Finance) na Mahadum steeti nke Nasarawa, bụ Ọkammụta Uche Ụwaleke, gosipụtara enweghị afọ ojuju ya n'ebe ihe ngụpụta a dị, ma dụzie gọọmenti dị iche iche ọdụ ka ha saa anya na mmiri ma chọpụta ihe n'ebuta ọnyụpa a, ma gbochie ya.
Na ntụnye ya, onye ji ego achụnta ego nọ n'Abụja, bụ Maazị Anthony Agbo, gbarụrụ ihu, ma kwuo na ọnọdụ a ga-eme ka azụmahịa dị iche iche ndị mmadụ new nwụọ, ma butekwa ihe isi nye ndị mmadụ.
Akụkọ ga-amasị gị: