You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Aisha, nwa mahadum Zaria akwụọla ụdọ
Akụkọ dị mkpa taa:
Aisha, nwa mahadum Zaria akwụọla ụdọ
Ozi si n'aka ndị uweojii Kaduna steeti na-ekwu na otu nwa ada a kpọrọ Aisha Abdulganiy akwụgbola onwe ya na Zaria.
Abdulganiy, onye bụ nwa ụlọakwụkwọ mahadụm Ahmadu Bello University Zaria nọ n'afọ atọ ya, ṅụrụ nsị were gbuo onwe ya.
N'ozi ọ hapụrụ, Aisha kwuru ka a taa nne na nna ya, ọkachasị nne ya, ụta maka ọnwụ ya.
O kwuru na nne ya anyụọla ya anya n'ụwa ya pụtara.
N'okwu ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kaduna steeti bụ Yakubu Sabo gwara BBC na "Aisha Abdulganiy nụrụ ihe a na-eche na ọ bụ nsị.
" E buga ya ụlọọgwụ ebe dọkita kwuru na ọ nwụọla pịị."
"Anyị akpọọla ndị mụrụ ya, ha nyekwara anyị ozi ihe mere."
Sabo gara n'ihu kwuo na ndị uweojii na-enyocha ka ya bụ ihe siri mee.
Otu akpụpụla Buhari ụlọikpe
Otu jịkọrọ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị anọghị na gọọmenti a kpọrọ 'Coalition Of United Political Parties' CUPP n'ichafu agbala onyeisiala Muhammadụ Buhari akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abụja maka atụmatụ iji ọnwa isii dọtịa oge onyeisi uweojii bụ Ibrahim Idris ga-anọ n'ọkwa ya.
Ọnụ na-ekwuru otu CUPP bụ Ikenga Imo Ugochinyere, kwuru na Idris kwesiri ịla ezumike nka n'abalị iri na ise nke ọnwa Janụwarị n'afọ 2019.
Nkeji ọhụrụ
Mmadụ 24 na-anata nleta maka ebola agbala ọsọ
Na mba Congo, mmadụ iri abụọ na anọ na-anata nleta ana-edebe ndị achọọ inyocha maka ọrịa Ebola esila n'ụlọ ebe edotara ha gbaa ọsọ ndụ dịka ọgbaghara dapụtara ka ndị mba ahu na-eme ngagharịiwe maka nkagbu akagburu ntuliaka onyeisiala e mere ụbọchị Sunday.
Ministrị na-ahụ maka ahụike mba ahụ kwuru na mmadụ iri na asaa na ndị ahụ gbara ọsọ bụ ndị enyochala ma hụ na ha enweghi ọrịa ahụ.
Ebe enyochabeghị mmadụ asaa.
Ụmụ ejima abụọ chọrọ ka otu nwoke lụọ ha
Ụmụejima ụmụnwaanyị abụọ arịọla ndị omeiwu mba Austriala ka ha mee iwu ga-ekwe ka nwoke lụọ ọtụtụ nwaanyị n'ime ka ha abụọ nweike ịlụ otu nwoke.
Anna na Lucy De Cinque, ndị dị afọ iri atọ na atọ ayịala nwoke ahụ afọ isii.
N'egwuregwu,
N'abalị Tọzde ka Southhampton ga-ezute Westham n'asọmpị Premier Ligi, ebe Arsenal ga-ezute Liverpool na Fraide, ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Disemba.
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ maka ọnwụ Alex Badeh
Ndị uweojii anwụchiela ndị echere na ọ bụ ha gbaburu onye bụbụ onyeisi ndị aghaelu bụ Alex Badeh
Cheta na ndị omekome gbagburu Badeh n'ụbọchị 18 n'ọnwa disemba dịka o si n'ubi ya alọta n'okporoụzọ Abuja na Keffi.
Ndị uweojii ekwuola na ha ga-egosi ndị ntaakụkọ ihu ndị mmadụ ahụ n'oge adịghị anya n'Abuja.
Ọzọ
Otu onye agha Naịjirịa emeruola ahụ dịka ndị Boko Haram na ndịagha Naịjirịa kwatara ya n'obodo Baga dị na Borno steeti.
Ndị agha Naịjirịa depụtara site n'akara Twitter ha na gbara mbọ chụsasịa ndị oyindụegwu ahụ chọburu ịwakpo nakwa chụọ ha ọsọ.
Na mba Ofesi
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na nwiunye yabụ Melania nọ na mba Iraq ugbua dịka ha gara nleta ndịagha ndị Amerịka na-alụ ọgụ ebe ahụ.
Ha mere nke a iji kele ndịagha ahụ maka "ọrụ ha na mmeri ha".
N'egwuregwu,
A na-anụ kepu kepu na ọ bụ na mba Ijipt ka a ga-eme asọmpị iko mbna Afrịka n'afọ 2019.
Cheta na anapụrụ mba Cameroon ikike ị me ya bụ asọmpị mbụ.
Nkeji nke ụtụtụ