Zamfara Killings: Ndi mmadụ abaala okporoụzọ n'obodo Tsafe igosi iwe ha maka ogbugbu mmadụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị mmadụ bara okporoụzọ taa n'obodo Tsafe dị na Zamfara steeti igosi iwe ha maka ogbugbu mmadụ na mwakpo ndị ọzọ na-eme na steeti ahụ.

Ihe nkiri ndị mmadụ tinyere na Facebook gosiri ọtụtụ mmadụ ji osisi na mma na-aghagharị ma na-ekwu "anyị achọghị".

Onye ntaakụkọ BBC Hausa gwara BBC Igbo na ọ bụ maka ahụghị enyemaka gọọmenti banyere ọtụtụ mmadụ gbara ọsọndụ bata Tsafe, bụ iwe ndị a na-eme ngagharịiwe.

N'ụbọchị Satọde gara aga, bụ Disemba 22, 2018, mmadụ 16 nwụrụ n'obodo Magamin Diddi dị n'okpuru ọchịchị Muradun.

Aka na-achị Tsafe bụ Aliyu Abubakar Tsafe, gwara BBC na Satọde ahụ mere ya abalị atọ ndị omekome a na-abịa obodo Asaula, nke mere ndị mmadụ ji gbaa ọsọndụ.

Ọ bụ iwe ogbugbu mmadụ a mere ndị mmadu jiri na-eme ngagharịiwe.

Ugbua ndị uweojii na ndị agha agaala obodo ahụ iji hụ na a kwụsịrị ngagharịiwe a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: