You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Bethlehem: Lee ka ndị si ebe a mụrụ Jesu si agba Ekeresimesi ha
Akụkọ na-eru anyị nti na-ekwu na ndị Bethlehem ebe a mụrụ Jesu na-agba Ekeresimesi n'ụzọ pụrụ iche.
Ụlọ ezumike dị iche iche juru kpum kpum makana ndị njem nsọ jupụtara n'ime ya.
Nchekwa zuru oke dịkwa.
Ha gbakọtara n'abali fopụtara ụbọchị Ekeresimesi kwụrụ n'ahịrị ịhụ ebe e kwuru a mụrụ Jesu Kristi.
A kakwara ụka ime abali ebe Pope Francis dowere ụka na Vatican iji wee ṅụ ọṅụ ọmụmụ Jesu.
N'agbanyeghị mwakpo ndị Palestinian n'oge gara na Bethlehem, akụkọ kwuru na ihe niile na-aga nke ọma.
Ọtụtụ emume na-enye obi anụrị na-agakwa n'ihu n'ụka a kpọrọ "Church of Nativity" Bethlehem.
Obodo Israel were ogige gbochie mwakpo ndị Palestine kemgbe afọ 2015.
Ndị Palestinian na-ahụta nke a dịka ị nara ha ala ha makana ha na-ekwu na ogige ahụ metụtara oke ala ha.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: