You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mininum Wage: Kee nkwụcha, anyị na-apụ ama - NLC
Otu na-ahụ maka ihe gbasara ndị orụ na Naịjirịa akpọrọ NLC n'ichafụ ekwuola na ha ga-eme ngagharịiwe n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwari 2019.
Ha kwuru na ọ bụ iji gosi iwe ha maka ndọtị gọọmenti etiti na-adọti mmezu mbulite ego ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ.
Akụkọ na-ekwukwa na ndị isi otu NLC kwuputere nke a n'ọgbakọ National Executive council meeting ha mere.
Dịka onyeisioche ha bụ Ayuba Wabba nakwa odeakwụkwọ ha bụ Peter Ozo-Eson si kwuo, ngagharịiwe a ga-eme na steeti niile dị na Naịjirịa.
Nke a na-emekwa dịka onyeisiala Buhari kwuru na ọ ga-ekpokọba otu ọzọ ilebanye anya ka a ga-esi mezuo ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ ndị ọrụ.
Mana ndị mmadụ amanyela ọnụ n'elu soshal midia gbasara okwu a:
@dotenyinkeawas1 kwuru na mkpebi a bụ ihe ịkpa ọchị.
@afobelly na-ajụ kedụ onye ga-eso ha mee ya bụ ngagharịiwe?
Mana @AinaAdeola6 kwuru na ndị ọrụ Naijirịa anaghị erite uru ha n'uju.
@Klinsdon kwuru na ọnwa Jenụwarị ka tere aka ime ya bụ ngagharịiwe.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: