You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Charly Boy: Ọ bụghị alụkwaghịm kama ọ bụ inwogharị ịhụnanya anyị
Charly Boy kwuru na ọ bụ inwogharị ịhụnanya dị n'etiti ya na nwunye ya bụ Diane "Lady D", ka ọ chọrọ ime na ọ bụghị ịgba alụkwaghịm.
Charly Boy kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ya n'ekwentị ịjụ ihe mere o ji dee na soshial midia na ọ chọrọ ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma lụgharịa nwaanyị ọzọ.
N'elu soshal midia, o dere na ọ na-agba nwunye ya alụkwaghịm makana "ha abụọ ahụchaala onwe ha, na oge eruola maka ihe ọhụrụ".
Ka BBC Igbo jụrụ ya ajụjụ a, o were olu ọchị sị "ehenụ! Anaghị m alụzị makana anọọla m ebe ahụ afọ iri anọ, anyị asị ka anyị "chenjikwaanụ gear".
"Mana mmadụ ole ghọtakwaranụ na ọ bụ otu onye ahụ ka m na-aga ịlụ?
"Ị ga-agba alụkwaghịm n'otu ụbọchị ma lụọ nwaanyị ọzọ n'echi ya? Enwerenu etu ọ dị.
M na nwunye m na-alaghachị n'ụlọọụka inwogharị mkpebi ịhụnanya anyị kpebiri afọ ole gara aga."
O kwuru na onweghi mgbe ọ chọrọ ịgba alụkwaghịm kama na ndị mmadụ ghọtaghiere ihe o dere n'akara soshal midia.
Cheta na Charly Boy na Diane ebiela ihe ruru afọ iri anọ ma nwekwaa ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ gbara ha gburugburu.