You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#NextLevel: Ọ bụ ezie na APC kọpịrị ihe onye ọzọ mere?
Onyeisi mgbasaozi maka achụmnta vootu nke onyeisiala Muhammadu Buhari, bụ Festus Keyamo ekwuola na ebubo na e zuru akara "NextLevel" ezu bụ ụgha.
Ihe na-akpọtụ na soshal midia nakwa intanet n'ụtụtụ Tuzde bụ ebubo na onyeisiala Muhammadu Buhari na otu APC kọpịrị akara njirimara ụlọakwụkwọ n'mahadum dị na mba Amerịka were mee akara ozi ịchụnta vootu ya.
Ụbọchị Ụka, onyeisiala Buhari wepụtara nkwa ihe ọ ga-emere ụmụ Naijiria ma ọbụrụ na ha tụnyere ya n'afọ maka ntuliaka 2019.
Na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ BBC nwere n'ekwenti Keyamo kwuru na ebubo ahụ sị n'aka otu PDP bụ nkata ndị iro kpara iji kwere ha ọnya.
"Ọ bụghị ezi okwu. Anyị nwere nke bụ nke anyị. Nke a bụ mpụ nke ndị na-akwado PDP na-akpa. Njirimara nke ọzọ bụ akpụrụ akpụ nke ndị na-akwado otu PDP kpụrụ."
Mana dịka ndị otu APC na-agosikwa ike na nkata ahụ bụ aka ọrụ ndị iro ha, nyocha BBC Igbo mere gosiri na onyeisiala Buhari na ọtụtụ ndịọrụ ha tinyere akara ahụ n'igwe okwu ha na soshal midia.
Ojeozi mgbasaozi Buhari na soshal midia bụ Bashir Ahmad jiri akara ahụ nke ha kwuru n' ọbụghị nke ha zipu ozi.
Ndi kwe na ndị ekweghị
Ebubo etinyela ịkọ ọnụ na-etiti ndị na akwado APC nakwa ndị na-akwado PDP