Chike Ukaegbu: O nweghi ihe jịkọrọ ndị kara nka na ọdịnihu anyị
Chike Ukaegbu bụ nwa afọ Igbo a zụrụ na mba Amerịka.
Ọ laghachiri Naịjirịa ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019 n'okpuru otu ndọrọndọrọ AAP.
Mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ, ọ kọwara na ọganihu Naijiria adịghị n'aka ndị karala nka n'ihi na ọ bụ ha dowere Naijiria n'ọnọdụ ọ nọ ugbua.
N'ihe gbasara asụsụ Igbo, Ukaegbu tara ndị nne na nna ụta na ọ bụ ha mere na ụmụ ha amaghị asụ Igbo dịka o kwesịrị.
Gee ya n'uju ebe a.


