Obi adịghị ndị mmadụ mma maka nzukọ IBB na Oby Ezekwesili

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Oby Ezekwesili na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa, kpalitere okwu n'ọnụ ndị mmadụ ka o tinyere foto gosiri ka ọ nọ n'ụlọ IBB.

IBB ezigbo aha ya bụ Ibrahim Badamosi Babangida chịburu Naịjirịa dịka onye agha, mana o so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.

Ka Ezekwesili tinyere foto ahụ, o kwuru sị "mụ na Ibrahim Babangida bụbụ onyeisiala kpara nkata na Minna ka m kwuchara okwu gbasara ịzụpụta mmadụ nke Bekee kpọrọ 'Human Capital Development' n'ụlọakwụkwọ El Amin ụnyaahụ.

Ekwuru m ya hoo haa na e kwesịrị ịnapụta Naịjirịa n'aka ndị 'ochie dike'. Nke a bụ ọrụ anyị bịara ịrụ."

Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ eziokwu ihe bugara ya n'ụlọ IBB.

Ihe ha na-ekwu

Ndị chọrọ ka ọ kọwaa ihe bugara ya

@FabrohOkisoh kwuru sị na IBB abụghị onye Ezekwesili kwesịrị izute ma ọ burụ na ọ chọrọ ịnapụta Naịjirịa n'aka ndị 'ochie dike'.

@MOHD_Ks kwuru sị na ọ gaara eji ohere o ji hụ IBB gaa hụ ụmụnwoke na nwaanyị na-azụ ahịa na Naịja steeti ma gwa ha maka ebumnobi ya ịzọ ọchịchị.

@SobolaAbiola1 kwuru na ọ gaghị akwadozi ya maka njem a o mere.

Ndị na-ahụghị ihe ọjọọ ọbụla n'ime njem o mere

@OmamuliFaka na ajụ ihe mere ndị mmadụ ji akatọ njem ahụ, na ọ kaara ikwu na ọ gaghị aga nkuzi ọ gara ime n'ụlọakwụkwọ ahụ?

@dymegyjoe kwuru sị na ọ dị mma na e nwere mmadụ na-eche ụdịrị echiche ọma a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị