You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị dọkinta n'Abuja ekewaala ejima gbakọrọ ọnụ
Ndị dọkinta na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ nkuzi nke mahadum Abuja kewara Ejima gbakọrọ ọnụ n'obodo gwagwalada nke dị n'Abuja ụnyaahụ.
Onye ndụ ndị dọkinta ndị a bụ Nuhu Kwajafa na-arụ ọrụ na ngalaba akpọrọ Global Peace Initiatives dere maka ihe a ha mere na akara Instagram ya bụ @nuhukwaj.
Dọkinta Kwajafa dere: "Anyi chọrọ ịkwuputa ezigbo ekene anyị, ka anyị na enye Yakubu Dogara ekene ọma maka etu o si kwụọ ụgwọ eji rụọ ọrụ a."
Ikewa ejima ndị ahụ were ndị dọkinta a ọtụtụ oge.
Nke a abụghị mbụ ndị dọkinta na Naịjirịa na-ekewa ejima.
N'ọnwa Juun nke afọ a, ndị dọkinta n'ụlọ ọgwụ Federal Medical Centre kewara Fatima na Maryam bụ ejima gbakọrọ ọnụ mgbe amụrụ ha.