Ndị dọkinta n'Abuja ekewaala ejima gbakọrọ ọnụ

Ndị dọkinta na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ nkuzi nke mahadum Abuja kewara Ejima gbakọrọ ọnụ n'obodo gwagwalada nke dị n'Abuja ụnyaahụ.

Onye ndụ ndị dọkinta ndị a bụ Nuhu Kwajafa na-arụ ọrụ na ngalaba akpọrọ Global Peace Initiatives dere maka ihe a ha mere na akara Instagram ya bụ @nuhukwaj.

Dọkinta Kwajafa dere: "Anyi chọrọ ịkwuputa ezigbo ekene anyị, ka anyị na enye Yakubu Dogara ekene ọma maka etu o si kwụọ ụgwọ eji rụọ ọrụ a."

Ikewa ejima ndị ahụ were ndị dọkinta a ọtụtụ oge.

Nke a abụghị mbụ ndị dọkinta na Naịjirịa na-ekewa ejima.

N'ọnwa Juun nke afọ a, ndị dọkinta n'ụlọ ọgwụ Federal Medical Centre kewara Fatima na Maryam bụ ejima gbakọrọ ọnụ mgbe amụrụ ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: