You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abuja: Ihe ruru mmadụ 11 anwụọla n'ọgbaaghara ndị Shi'a
Ozi na-eru BBC ntị ugbua ekwuola na ihe ruru mmadụ iri na otu anwuola na ọgbaghara ndị na etiti ndị agha Naijirịa na ndị "Islamic Movement of Nigeria."
BBC enweghi ike ikwu ka ọnụ ọgụgụ ndị a asị na ha nwuru ọ bụ eziokwu ka ọbụ ụgha.
Ọgbaaghara na-akpọtụ n'ụzọ Maraba bụ nke dịketere Abuja.
Onye nta akụkọ BBC tọrọ na gbachịgbachị dị n'ụzọ ahụ kọrọ anyị nke na-akpọtụ na-ebe ahụ kemgbe ehihie.
Ndị akaebe nọ ebe ihe na-eme gwara BBC na ndị otu Shiite a na-agara onwe ha mgbe ha ruru ebe ndị agha na-echenche, ndị agha ahụ sị ha lachie azụ.
Ma di Shiite ahụ kpọrọ ekwo nkụ na-agara onwe ha.
Ndị akaebe sị na mgbe dị agha na-agbali egbe elụ ka were chụsaa ndị ngagharị iwe a, kama ha ga-agbawa ọsọ, ha atụwa ha okwute.
Onye nta akụkọ BBC nọ ebe ahụ sị na ya na-anụ mgbọ egbe aghara aghara ebe gọmentị nyegoro iwu ka emechie ụzọ awaraawara gawara Kubwa maka ọgbaagha ahụ.
Ka a na-ekwu, ka a na-ekwu ọtụtụ mmadụ abanyele sochal midia maka ya bụ okwu.
Ụbụchị ụka ka ndị agha Naịjịrị kwetere na naanị madụ atọ ndị Shiite anwụrụ anwụ ebe ndị otu ha abụọ meruru ahụ na ọgbaaghara dara n'ụzọ Zuba na Satọde.
Ka ọ dị ugbua ndị agha ekeele nkwụcha na ọtụtụ ebe n'Abuja bụ isi obodo Naịjirịa.