2019 Election: Okorocha asaala APC okwu ha gwara ya na ọ dara ada

Aha onyonyo, "O nweghi onye ọzọ ka Uche Nwosu mma" - Okorocha

Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na onye odeakwụkwọ mgbasa ozi pati APC bụ Lanre Issa Onilu ezipụla ozi ọjọọ banyere APC na mbaụwa.

Okwu a bụ na nzaghachị okwu Issa kwuru na ụfọdụ ndị gọvanọ APC anabataghị mmeri e meriri ha na ntuliaka imeụlọ ha mere na nso nso a.

Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụ sọ ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu ga-emeri ntụlịaka gọvanọ n'ọkwa APC.

O kwuru nke a dịka otu ụlọịkpe n'Abuja mapụrụ ikpe dị n'etịtị Uche Nwosu na Hope Uzodinma bụ ndị abụọ meriri ntụlịka imeụlọ n'Imo iji zọọ ọkwa gọvanọ n'okpuru APC.

Nke a pụtara na n'uche Rochas, sọsọ Nwosu ga-azọtara APC Imo steeti na 2019.

Akukọ ndị ga-amasị gị: