Ezekwesili: A chọrọ m ka Buhari pụta ka anyị dọrịta ụka n'ọgbọ
Dịka o si che Buhari na Atiku aka mgba, Oby Ezekwesili ekwuola ka o ha ya n'ọnụ gbasara ntuliaka 2019.
Ọ gwara BBC Igbo ụfọdụ ihe mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ụzọ ọ ga-esi chịa Naịjirịa ma ọ nweike merie.
Gee n'uju etu o siri saa ya bụ ajụjụ.

Ebe foto si, Getty
Oby Ezekwesili, bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati Allied Congress Party of Nigeria (ACPN) mara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ pụta n'ọgbọ ka ha mee ndọrịtaụka nke a kpọrọ 'debate' na bekee.
N'akwụkwọ ozi o binyere aka ya, Ezekwesili onye so ndị ndu otu Bring Back Our Girls rịọrọ ụmụ Naịjirịa ka ha aghara ikwenye ka onye ọzọ kwuchitere ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 ọnụ ha na ndọrịtaụka ọbụla.
Ezekwesili chọrọ ka ya na Buhari dọrịta ụka n'ihe o mepụtara kemgbe o ji banye ọchịchị n'afọ 2015, na abụghị na osote ya bụ Yemi Osinbajo ga-adọ n'aha Buhari ."Ụmụ Naịjirịa ga-atụnyere onyeisiala, ọ bụghị osote ya.
"Ikwu okwu ndị ọzọ ịga-anọchite ndị na-azọ ọkwa onyeisiala bụ mkparị nye nde kwuru nde ndị a na-achị."
Na nsonso a, ọtụtụ ndị Naijiria na-akpọ oku ka Buhari na ndị ọzọ na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 nwe ndọrịtaụka, ebe ndị ihe Buhari na-amasị chọrọ ka ọ bụrụ ndị osote Buhari bụ Osibanjo ga dọọ ụka n'aha Buhari.
Akụkọ ndị ga-amasị gị









