Lagos Airport: Ndị njem tọrọ na MM2 ka ndi ọrụ na-eme ngagharị iwe

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụkwụ tọrọ ọtụtụ ndị njem ụgbọelu n'ụzọ dịka ndị otu ndịọrụ ụgbọelu dị ise kpochiri ọdọụgbọelu Muritala Muhammed nke abụọ (MM2) n'ụbọchị Wenezde iji gosi iwe maka ndị otu ha mmadụ 20 a chụrụ n'ọrụ.

Ụlọọrụ Bi-Courtney Aviation Services Limited (BASL), ndị na-achịkọta ọdọụgbọelu MM2 chụrụ ndị ahụ n'ọrụ na mbido afọ 2018.

Ndị otu ndịọrụ na-akpa ike ahụ gụnyere; otu National Union of Air Transport Employees (NUATE) ; Air Transport Services Senior Staff Association of Nigeria (ATSSSAN), nakwa 'National Association of Aircraft Pilots and Engineers (NAAPE).'

Ha egeghị n'iwu ụlọikpe nyere nụbọchị Tuuzde ka ha ghara igbosa ka o si aga n'ọdọụgbọelu ahụ dịka ụlọọrụ Bi-Courtney gbara ha akwụkwọ n'ụlọikpe.

Otu onye na-arụ n'ọdọụgbọelu gwara BBC Igbo na "otu jịkọrọ ndị ọrụ na-eme nghariiweagba abụbọ ọrụ."

Ọnụ na-ekwuru otu ndị ọrụ ahụ ngalaba nke Legọs bụ Anthony Ijeh gwara BBC na 'ihe mere bụ na ndị ụlọ Bi-Cortney achọghị ka ndị ọrụ ha bụrụ ndị otu anyị."

Akụkọ ga-amasị gị