Gịnị mere ọsọ ji ata n'APC?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ama ya dịka 'mama Taraba' mana ụbọchị Septemba 29, 2018, Aisha Alhassan wepụtara akwụkwọ arụkwaghịm nye onyeisiala Muhammadu Buhari.

Alhassan pụrụ n'otu APC, ma ritukwaa n'ọkwa ya dika minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na Naịjirịa.

Lee ihe o depụtara n'elu Twitter ya:

"Taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Septemba nke afọ 2018, ọ bụ ebumnobi m ime ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari mata mkpebi m itinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na Naịjirịa nakwa dịka onye otu "All Progressives Congres" (APC).

N'ime akwụkwọ arụkwaghịm o depụtara onyeisiala, o kwuru na ọ bụ maka na-enyeghị ya ohere ị zọ oche gọvanọ n'otu APC mere o ji puo n'otu ahụ nakwa na ọkwa ya dịka minista.

O kwuru na ihe gbagọjuru ya anya bụ na ọ nweghị ihe ndị isi pati APC kwuru bụ ya kapatara e ji kwụsị ya ị zọ ọchịchị.

Chetanu na onye onyeisiala Naịjirịa nabatara ebumnobi Alhassan mgbe ọ rịọrọ ya ikike i zọ ọche gọvanọ Taraba steeti.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mkpebi Mama Taraba:

@Naijapoet kwuru na ọ bụ ihe mgbawa obi mana ụta diri Alhassan makana ọ rụghị ọrụ ya ọfụma.

@GimbaMamu kwuru na ọ bụ makana Alhassan na-kwado pati ọzọ nabụghị APC.

Mana @ilmanati kwuru na ọ bụ iheoma ma tokwa Alhassan.

@shamonk kwuru na n'agbanyeghị etu ndị APC si ahụta Mama Taraba , ọ ga-amitanwụrụ ha mkpụrụọma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: