You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gịnị mere ọsọ ji ata n'APC?
Ama ya dịka 'mama Taraba' mana ụbọchị Septemba 29, 2018, Aisha Alhassan wepụtara akwụkwọ arụkwaghịm nye onyeisiala Muhammadu Buhari.
Alhassan pụrụ n'otu APC, ma ritukwaa n'ọkwa ya dika minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na Naịjirịa.
Lee ihe o depụtara n'elu Twitter ya:
"Taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Septemba nke afọ 2018, ọ bụ ebumnobi m ime ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari mata mkpebi m itinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na Naịjirịa nakwa dịka onye otu "All Progressives Congres" (APC).
N'ime akwụkwọ arụkwaghịm o depụtara onyeisiala, o kwuru na ọ bụ maka na-enyeghị ya ohere ị zọ oche gọvanọ n'otu APC mere o ji puo n'otu ahụ nakwa na ọkwa ya dịka minista.
O kwuru na ihe gbagọjuru ya anya bụ na ọ nweghị ihe ndị isi pati APC kwuru bụ ya kapatara e ji kwụsị ya ị zọ ọchịchị.
Chetanu na onye onyeisiala Naịjirịa nabatara ebumnobi Alhassan mgbe ọ rịọrọ ya ikike i zọ ọche gọvanọ Taraba steeti.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mkpebi Mama Taraba:
@Naijapoet kwuru na ọ bụ ihe mgbawa obi mana ụta diri Alhassan makana ọ rụghị ọrụ ya ọfụma.
@GimbaMamu kwuru na ọ bụ makana Alhassan na-kwado pati ọzọ nabụghị APC.
Mana @ilmanati kwuru na ọ bụ iheoma ma tokwa Alhassan.
@shamonk kwuru na n'agbanyeghị etu ndị APC si ahụta Mama Taraba , ọ ga-amitanwụrụ ha mkpụrụọma.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: