You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#Ipobsitathome: Egwu ji ndị mmadụ n'ala Igbo
Egwu amaghị ihe taa ga-abụ ji ndị mmadụ bi ọwụwa anyanwu kemgbe ụnyaahụ dịka ndị uweojii na-agaghara n'ihe ha kpọrọ 'igosi ike' nke ha kwuru bụ iji gbaa ndị mmadụ ume na ha dị njikere ichekwa ha.
Ụnyaahu ọtụtụ ahịa ebe ana ere ngwa nri na-ekwo n'ala Igbo dịka ndị mmadụ na-azụ ihe ha ga-eri taa.
Otu onye achọghị ka-akpọ aha ya bi na Nnewi kwuru "ebe ọtụtụ ndị uweojii na-eme ngagharị nke a butere egwu n'obi ndị mmadụ nakwa ndị chọburu ịpụta iro, ịnọsi ike n'ụlọ".
Onye ọzọ achọkwaghị ka akpọpụta aha ya gwara BBC n'ekwentị na "kemgbe ụnyaahụ ndị mmadụ na-azụ nrị ha ga-eri taa iji mee ka ịhe ọbụla ghara ị kpọpụ ha n'ezi taa".
Ndị otu Ipob kpọrọ oku ka Ndigbo nọrọ n'ụlọ n' ụbochi Septemba 14,2018, iji kwanyere ndị e gburu n' 'Egwu Eke' Ndị agha gbara n'ala Igbo afọ. 2017.
Ebe ndị uweojii na-ekwu ka ndị mmadụ ghara ige ntị otu ahụ na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra nkịtị n'ihi na ka ga-enye ha nchekwa.
Ipob nwetara nkwado otu nwereonwe dị 11, ebe otu dịka Biafra Independet Movement(BIM) akwụnyeghị na nnọrọnụlọ ahụ.
Cheta na otu Ipob mere nnọrọnụlọ n'ọnwa May 30 iji cheta ndị nwụrụ n' Agha Biafra.